Nana Klutse
A mụrụ
Nana Ama Browne Klutse | |
---|---|
Born | 23 May 1981 |
Nationality | Ghanaian |
Occupation | Climate scientist |
Employer | University of Ghana |
Known for | Chapter Atlas - IPCC Sixth Assessment Report |
Nana Ama Browne Klutse na ka ọnwa Mee dị na mkpụrụ ụbọchị iri abụọ na atọ n'afọ 1981 na Nyanfeku Ekroful . Ọ gụrụ akwụkwọ praịmarị na Anomabo Methodist Primary nakwa JHS.[1]
Ọ gara n'ihu n' ụlọ akwụkwọ sekọndrị Mfantsiman Girls ma mecha gaa Mahadum Cape Coast na Ghana ị gụ ma nweta nzere BSc na Physics. Ọ gara n'ihu ma nweta nzere Ph.D. ya na Climatology na Mahadum Cape Town na South Africa.
Ọrụ sayensị
dezieDr Klutse na-amụ banyere ọnọdụ ihu igwe nke West Africa. Ọrụ ya na-elekwasị anya n'ihe gbasara sayensị ihu igwe tụmadị mmiri ozuzo nke Afrịka.[2][3] Ọ bụ onye nkuzi dị elu na Ngalaba Physics, na Mahadum Ghana.[4] N'oge gara aga, ọ na-elekọta ngalaba a kpọrọ Remote Sensing and Climate Centre.[5] Klutse bụ onye na-ahụ maka sayensị ihu igwe nke African Institute for Mathematical Sciences[6] nakwa onye isi odee naenyere aka edepụta nke akpọrọ IPCC Sixth Assessment Report (AR6). Ọ na-agbakwa ụmụaka ndị nwaanyị nọ na Ghana ume ka ha tụlee ọrụ sayensị ma na-akwado mmelite na agụmakwụkwọ sayensị na mba ahụ.[7]
Klutse rụrụ ọrụ nụlọ ọrụ a kpọrọ Ghana Space Science and Technology Institute nke Ghana Atomic Energy Commission dị ka onye isi nchọpụta sayensị site n'afọ 2016 ruo 2018. Tupu nke a, ọ bụ onye nkuzi ọbịa na West African Science Service Centre on Climate and Adapted Land Use (WASCAL) na Akure, Nigeria.[8]
Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị
dezieKlutse na-arụkwa ọrụ na ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị ka onye otu National Democratic Congress.
Ebensidee
dezie- ↑ Ghana's Dr. Nana Ama Browne Klutse among lead authors for 6th climate change report (en-US). Citinewsroom - Comprehensive News in Ghana (2021-08-18). Retrieved on 2021-08-20.
- ↑ Klutse, NAB et al. (2016). Daily characteristics of West African summer monsoon precipitation in CORDEX simulations. Theoretical and Applied Climatology, 123(1-2): 369-86.
- ↑ Klutse NAB et al (2018). Potential impact of 1.5 °C and 2 °C global warming on consecutive dry and wet days over West Africa. Environmental Letters, 13(5). https://doi.org/10.1088/1748-9326/aab37b
- ↑ Donkor. "Dr Nana Ama Browne Klutse joins NDC Abura Asebu Kwamankese race", Graphic Online, 26 July 2019. Retrieved on 8 January 2021.
- ↑ Nana Ama Browne Klutse: Ghanaian scientist studies dynamics of west African monsoon. Future Climate for Africa (21 December 2016). Retrieved on 8 January 2021.
- ↑ AIMS announces first cohort of women in Climate Change Science Fellows (2018-05-15).
- ↑ Ampofo (26 February 2018). Mfantseman: Science teachers trained in effective teaching methods. Citi 97.3 FM News. Retrieved on 3 April 2020.
- ↑ Donkor. "Dr Nana Ama Browne Klutse joins NDC Abura Asebu Kwamankese race", Graphic Online, 26 July 2019. Retrieved on 3 April 2020. (in en)