Nafisat Abdullahi
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
ụbọchị ọmụmụ ya | 23 Jenụwarị 1991 |
Ebe ọmụmụ | Jos |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Asụsụ Hausa |
ọrụ ọ na-arụ | omee |
ebe agụmakwụkwọ | London School of Photography |
Ebe obibi | Kaduna |
oge ọrụ ya (mmalite) | 2010 |
Nafisat Abdulrahman Abdullahi onye ama ama dịka Nafisat Abdullahi (amụrụ ya ka ọnwa Jenụwarị dị na mkpụrụ ụbochị iri abụọ na atọ n'afọ 1992), Ọ bụ nwaafọ Nigerian, onye na-emeputa ihe nkiri, onyenkwado , onye nhazi Ọsee foto na onye ọchụnta ego si Jos, Plateau Steeti,Dịka nwanyị Ji ego achụ ego ọ guzobere obere ụlọ ọrụ abụọ. [1] Nafisat gụrụ akwụkwọ gbasara theater arts site na University of Jos mana ugbu a ọ na-agụ ihe gbasara ise foto pụrụ iche n'ụlọ akwụkwọ na-akuzi maka ise foto di na mba UK. O nwetere ọtụtụ onyinye , dịka Afro Hollywood Award n'afọ (2017), MTN award n' afọ (2016), AMMA Award (2015) na City People Entertainment Award n' afọ 2013 [2]Kannywood Award n'afọ 2014 Choice Award . [3] Ọrụ ihe nkiri ya bidoro mgbe ọ dị afọ iri na asatọ mgbe o so mepụta ihe nkiri mbụ ya akpọrọ, Sai Wata Rana n'afọ 2010 nke ndị ụlọ ọrụ FKD Production kwadoro ebe Ali Nuhu. bụ onye nhazi.
N'afọ 2012, Nafisat soro mee Blood and Henna, ihe nkiri emere na Naịjirịa nke Kenneth Gyang haziri ya na Ali Nuhu Sadiq Sani Sadiq . A rọpụtara ha ugboro isii na mmemme 9th Africa Movie Academy Awards ma nwee ihe nrite Best Costume Design . [4] O putara na ihe nkiri akpọrọ, Lamiraj ma nweta ihe onyinye ''Best Actress'' n'afọ 2013 nakwa n'ihe nkiri, ' Ya Daga Allah n'afọ 2014 nke Aminu Saira haziri, ugbu a 'afọ 2020 Nafisa abdullahi bụ nwaanyị kacha emepụta ihe nkiri nke egwuregwu akpọrọ labarina nke Aminu Saira haziri na-egosi na arewa24 tv ụbọchị Mọnde ọ bụla.
Mmalite ndụ na ezinụlọ ya
dezieAmụrụ na Jos, isi obodo Plateau State, Nigeria, Nafisat bụ nwa nwanyị nke anọ nke Abdulrahman Abdullahi onye bụ onye na-azụ ahịa ụgbọala na onye okenye ọnụ na-eru n'okwu. Ọ gụrụ akwụkwọ n'ụlọ akwụkwọ ndị Air Force dị na Jos mgbe ọ kwagara Federal Capital Territory ọ gara ụlọ akwụkwọ sekọndịrị nke ụmụ nwaanyị dị na Dutse, Abuja, O mechara gaa Mahadum nke Jos ebe ọ gụrụ ma nweta digiri na theater arts. Dika nwaata, O sonyere ndị otu Kannywood ebe o bidoro imepụta ihe nkiri site na nkwado ndị ụlọ ọrụ FKD Production na Ali Nuhu
Ọrụ
dezieỌ malitere ọrụ ihe nkiri ya mgbe ọ dị afọ iri na asatọ na FKD Production dị ka ihe nkiri mbụ ya, Ọ pụtara na Sai Wata Rana n'afọ 2010 nke onye nkwado na nhazi ya bụ Ali Nuhu. [ <span title="This claim needs references to reliable sources. (August 2017)">see okwu dị mkpa</span> ] Ọ bụ nwanyị na-azụ ahịa na onye guzobere Nahaz Brand n' ụlọ ọrụ na-emepụta ihe nkiri. . N'afọ 2013, a kpọrọ ya na Berlin International Film Festival dịka otu n'ime mmadụ abụọ si Naịjirịa na onye na-ese ihe nkiri na Nollywood ma mesịa kpọọ ya ka ememme Nollywood na Atlanta, Scotland. [ <span title="This claim needs references to reliable sources. (August 2017)">see okwu dị mkpa</span> ] N’ọnwa Juun afọ 2013, ndị kọmitii ịdọ aka ná ntị nke ndị Arewa Filmmakers Association na Nigeria kwụsịtụrụ ya n’ihi na ọ gaghị apụta n’ihu kọmitii ahụ mgbe akpọrọ ya ka ọ hazie mmemme a machibidoro site n’aka ndị na-eso ụzọ ihe nkiri Hausa. [5] E nyere ya akwụkwọ maka ịkwụsị orụ ruo afọ abụọ i site na kọmitii ịdọ aka ma emechara kpọghachi ya n'ọnwa Ọgost n'afọ 2013 tupu ọ gaa n'ihu isonye mee ihe nkiri Aminu Saira's Kalamu Wahid na ' Ya Daga Allah n'afọ 2014. [6] [7]
Ihe nkiri
dezieNafisat emeela ọtụtụ ihe nkiri onyonyo ndị Hausa , ụfọdụ n’ime ha bụ;Templeeti:Columns-list
Ihe nrite
dezieAfọ | Onyinye | Katigori | Ihe nkiri | Mpụtara |
---|---|---|---|---|
2013 | City people Entertainment Award [8] | Nwanyị kacha gosipụta agwa n'afọ ahụ
(Kannywood) |
Ya Daga Allah | mmeri |
2014 | City people Entertainment Award | Nwanyị kacha gosipụta agwa n'afọ ahụ (Kannywood) | Onyinye pụrụ iche | mmeri |
2014 | 1st Kannywood Awards | Nwaanyị kacha kpa agwa na Kannywood (Popular Choice Award) [9] | Dan Marayan Zaki | mmeri |
2014 | AMMA Awards | Nwanyị kachagosipụta agwa n'afọ ahụ | Dan Marayan Zaki | mmeri |
2015 | City People Entertainment Award | Nwanyị kacha gosipụta agwa n'afọ ahụ(Kannywood) | Onyinye Pụrụ Iche | mmeri |
2015 | 2nd Kannywood Awards | Nwanyị kacha eme ihe nkiri na Kannywood | Onyinye Pụrụ Iche | mmeri |
2016 | City People Entertainment Award | Nwanyị kacha gosipụta agwa n'afọ ahụ(Kannywood) | Onyinye Pụrụ Iche | mmeri |
2016 | AMMA Awards | Nwanyị kacha kpaa agwa n'afọ ahụ | Da'iman | mmeri |
2016 | 3rd Kannywood Awards [10] | Nwanyị kacha eme ihe nkiri na Kannywood | Baiwar Allah | mmeri |
Ebe nsi nweta
dezie- ↑ Actress Nafisa Abdullahi's Profile. Retrieved on 20 April 2015.
- ↑ Sani Danja, Nafisa Abdullahi, others bag top Awards. Retrieved on 20 April 2015.
- ↑ Ali Nuhu, Nafisa Abdullahi, late Ibro shine at Kannywood awards. Archived from the original on 31 October 2021. Retrieved on 21 April 2015.
- ↑ Blood and Henna. Retrieved on 12 September 2014.
- ↑ Nafisa Abdullahi Suspended from acting. Retrieved on 21 April 2015.
- ↑ Kannywood Producers Lift Suspension On Nafisa. Retrieved on 21 April 2015.
- ↑ Nafisa Abdullahi confirms romance with Adam Zango. Retrieved on 16 June 2015.
- ↑ Nafisat Abdullahi [HausaFilms.TV – Kannywood, Fina-finai, Hausa Movies, TV and Celebrities].
- ↑ T.I.N MAGAZINE: Actress Nafisa Abdullahi Full Biography (Kannywood).
- ↑ KANNYWOOD AWARD 2015 The full event.