Nadia Tromp
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
Aha enyereNadia Dezie
aha ezinụlọ yaTromp Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya31 Jenụwarị 1977 Dezie
Ebe ọmụmụFish Hoek Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye na-ese ụkpụrụ ụlọ Dezie
ebe agụmakwụkwọHarvard University Dezie

  Nadia Tromp (amụrụ na 31 Jenụwarị 1977) bụ onye South Africa na-ese ụkpụrụ ụlọ, nke a maara maka ọrụ ya na mmekọrịta mmadụ na ibe ya na ọha na eze, ọkachasị nlekọta ahụike n'ime mba South Africa.[1] N'afọ 2017 ọ bụ onye mmeri nke emume ihe owuwu ụwa na ngalaba ahụike maka ụlọ ọgwụ Westbury ya. O mechara nata onyinye nke afọ 2017 nke ịdị mma site na GIFA (Gauteng Institute for Architecture) na onyinye nke 2018 nke uru site na SAIA (South African Institute of Architects).[2] N'afọ 2019, ụlọ ọrụ ya meriri ihe nrite Masterprize nke ụlọ na ngalaba nke ngwakọta.[3]

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ dezie

A mụrụ Tromp na Fishhoek, South Africa. Ọ gụrụ akwụkwọ wee nwee akara ugo mmụta na Mahadum nke Cape Town, wee nweta nzere masta na Mahadụ Harvard. Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ ma rụọ ọrụ na Noero Wolff architects n'okpuru Jo Noero, ọ gara n'ihu bụrụ onye nduzi na Paragon Habitat Architects. N'afọ 2008, o guzobere ụlọ ọrụ ya "Ntsika Architects", nke pụtara ogidi ike ma ọ bụ ogidi ụlọ.[4][5]

Ụzọ e si emepụta ihe dezie

Tromp na-ebute ụzọ n'ihe owuwu nke nwere mmetụta mmekọrịta mmadụ na ibe ya.[6] Ọrụ ya na ụlọ ọgwụ na South Africa, nakwa mmekorita ya na gọọmentị, na ọrụ ya na mpaghara obodo emeela ka ọ bụrụ ọkachamara n'ọhịa ahụ. Tromp ekwuola okwu na mmemme AZA na Pretoria ma bụrụ onye ọka ikpe maka PPC Imaginarium Award for Architecture.[7]

Union Internationale des Architectes (UIA) dezie

Tromp nwere ọkwa onye nduzi nke International Union of Architects (UIA) "Community Architecture" - Architecture & Human Rights, Work program, ogbako zuru ụwa ọnụ na-aga n'ihu nke na-aga na nkwadebe maka UIA Congress ọ bụla, a ga-emecha ogbako a n'oge maka 2020 Brazil UIA Congress.[8]

GIFA (Gauteng Institute for Architecture) dezie

N'ọnwa Febụwarị afọ 2018, a họpụtara Tromp ka ọ bụrụ onye isi oche nke Gauteng Institute for Architecture, oge ya gwụrụ n'ọnwa Febụwarị 2020 mgbe a họpụtara onye isi oche ọzọ nke GIfA, Krynauw Nel.[9]

Ọrụ ndị a họọrọ[10] dezie

Ụlọ Ọgwụ Hillbrow Esselen Street[11] dezie

Afọ: 2014/15

Ebe: South Africa, Hillbrow

Ụlọ Ọgwụ Westbury[12] dezie

Afọ: 2014/15

Ebe: South Africa, Westbury

Westbury Transformation Development Centre[13] dezie

Afọ: 2015/16 - 2019

Ebe: South Africa, Westbury

Ọrụ ndị na-abịa n'irụ dezie

Rea Vaya BRT Stations & Urban upgrades dezie

Afọ: 2019 - 2022

Ebe: South Africa, Sandton & Gandhi Square

Onyinye na nkwanye ùgwù dezie

  • 2015 - 19millionproject onye mmeri nke MoHM (Museum of Human Migration) Mobile Modular Museum, Rome[14]
  • 2015 - Mbokodo South African Women in the Arts[15]
  • 2017 - Women in Construction Awards - onye ikpeazụ
  • 2017 - Onyinye nke uru maka Westbury Clinic Project - GIFA
  • 2017 - Ụlọ ndị a rụchara arụcha Onye mmeri maka Westbury Clinic Project - World Architecture Festival, Berlin[2]
  • 2018 - SAIA- Corobrik Merit Award: Westbury Clinic Project
  • 2018 - Onye isi oche nke Gauteng Institute for Architects (GIFA)[9]
  • 2018 - Onye nduzi nke International Union of Architects (UIA)

"Community Architecture" - Architecture & Human Rights, Ọrụ[8]

Ebensidee dezie

  1. On Trend in Architecture: Mesh. Visi (12 June 2018).
  2. 2.0 2.1 Overall winners 2017. www.worldarchitecturefestival.com.
  3. Westbury TDC.
  4. Staff Reporter (3 August 2009). Book of South African Women: Architects. The M&G Online.
  5. ABOUT - Gauteng - Ntsika Architects. Top Female Architect - Gauteng - Ntsika Architects. Archived from the original on 2022-05-16. Retrieved on 2022-06-18.
  6. Zuerita. Designing high-spec, public buildings. Archived from the original on 2022-06-26. Retrieved on 2022-06-18.
  7. PICS: A new District Six. Traveller (13 May 2018).
  8. 8.0 8.1 WorkProgramme. Archived from the original on 2022-01-18. Retrieved on 2022-06-18.
  9. 9.0 9.1 Presidents | GIfA | Gauteng Institute for Architecture | Johannesburg (Joburg), Gauteng, South Africa.
  10. Top Female Architect - Gauteng - Ntsika Architects. Top Female Architect - Gauteng - Ntsika Architects. Archived from the original on 2022-06-18. Retrieved on 2022-06-18.
  11. Esselen Clinic / Ntsika Architects (2017-08-21). Archived from the original on 2021-04-21. Retrieved on 2022-06-18.
  12. Westbury Clinic / Ntsika Architects (2017-08-02). Archived from the original on 2021-07-30. Retrieved on 2022-06-18.
  13. Westbury Transformation Development Centre (WTDC) is 90% Complete! (2018-11-16).
  14. Reflections on A Human Rights Crisis. Business Media MAGS.
  15. Mafika (15 September 2015). South African women in arts honoured.