Munyua Waiyaki
ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Kenya |
ụbọchị ọmụmụ ya | 12 Disemba 1926 |
Ebe ọmụmụ | Kikuyu |
Ụbọchị ọnwụ ya | 25 Eprel 2017 |
Ebe ọ nwụrụ | Nairobi |
ihe kpatara ọnwụ | Ọrịa oyi |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee |
ọrụ ọ na-arụ | Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị |
Ọkwá o ji | Member of the National Assembly, Minister for Foreign Affairs, Minister of Agriculture of Kenya |
ebe agụmakwụkwọ | Alliance High School, Adams College, University of Fort Hare, University of St Andrews |
Mbido ndụ na agụmakwụkwọ
dezieỌ gara ụlọ akwụkwọ nke akporo (Alliance High skull)rue n'afọ 1945. Ma mesia ga kọleji na Adams ebe ọ gụrụ fiscis, kemistri, na mgbakọ na mwepụ tupu ọ gaa Mahadum Fort Hare na Eastern Cape Province na South Africa maka nzere bachelọ nke sayensị.[1][2] O si South Africa rute Mombasa n'oké osimiri n'afọ 1951 mgbe nke ahụ gasịrị nna ya mere ka ọ mata Jomo Kenyatta na Mbiyu Koinange na ụlọ oriri na ọṅụṅụ dị n'okporo ụzọ Latema na Nairobi. Mgbe ọnwa ole na ole gachara, ọ gara agụmakwụkwọ ọzọ na Britain nke ọ gara n'ihu ruo mgbe ọ laghachiri Kenya na afo1958. Gọọmentị Kenya nyere ya ọrụ ka ọ rụọ ọrụ dị ka dọkịta, ọkwá ọ rụrụ n'ihe na-erughị otu afọ kemgbe ọ lara ezumike nká ma họrọ ịmepụta ụlọ ọgwụ nke ya na Victoria Street (nke a maara ugbu a dị ka Tom Mboya Street). N'otu oge ahụ, ọ malitere ịrụsi ọrụ ike na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ebe ọ bụ na ọ rụrụ ọrụ dị ka onye isi oche distrikti nke Kenya African National Union (KANU) n'oge 1960-1968.
N'afọ 1962, ọ mara Tom Mboya aka maka oche ndị omeiwu nke Nairobi East mana o ji vootu 2668 merie na 31407. Ọ banyere n'ụlọ omebe iwu na nke mbụ ya na onwa ise na afo1963 dị ka onye omebe iwu maka North Eastern Nairobi (nke bụzi Kasarani) ọ ghọkwara odeakwụkwọ na-adịgide adịgide maka ulo oru ahuike na ụlọ obibi N'afọ 1963, a họpụtara ya ka ọ bụrụ odeakwụkwọ ndị omeiwu.[3]
N'abalị iri abụọ na ise n'ọnwa Eprel afọ 2017, a kọrọ na Waiyaki nwụrụ n'ụlọ ọgwụ Aga Khan dị na Nairobi mgbe ọ na-agwọ ya ọrịa.[4]
- ↑ Munyua Waiyaki — Munzinger Biographie. munzinger.de (2012). Retrieved on 30 July 2012.
- ↑ John Iliffe (27 August 1998). East African Doctors: A History of the Modern Profession. Cambridge University Press, 114–. ISBN 978-0-521-63272-0. Retrieved on 30 July 2012.
- ↑ (11 June 1963) Kenya Gazette, 643. Retrieved on 5 January 2013.
- ↑ Former minister Munyua Waiyaki dies at 91. Archived from the original on 2017-04-25. Retrieved on 2023-06-19.