Mootral
Mootral bụ ụlọ ọrụ nké Britain na Switzerland nke na-emepụta ihe mgbakwunye nri iji belata ikuku methane sitere na anụmanụ na-eri nri, ọkachasị ehi na atụrụ, kamakwa ewu.[1] Methane bụ nnukwu gas na-ekpo ọkụ ma na akụkọ nké anọ nkè Intergovernmental Panel on Climate Change (IPCC) na-atụ aro ka ọ mụbaa site na x23 ruo x72 multiplier n'ihi oke mmetụta ya na carbon dioxide na obere ogologo ndụ na ikuku ụwa.
Ihe mgbakwunye nri sitere n'okike
dezieỌ bụ Neem Biotech na-emepụta ihe mgbakwunye nri sitere n'okike Mootral. Ihe na-arụ ọrụ bụ ihe organosulfur compound (nke a na-ahụkarị na galik), Nnyocha na Mahadum Aberystwyth, Wales egosila mbelata ruru pasentị iri itoolu na anọ na mmepụta methane.
Azụmaahịa ikuku
dezieỤlọ ọrụ ndị na-eji mgbakwunye nri Mootral na-emepụta ego carbon nkè enwere ike iji mee ka ha belata ọkwa ha ma ọ bụ ree ndị ọzọ.[1] N'ọnwa Disemba afọ 2019, Verra kwupụtara na ọ kwadoro Mootral dị ka usoro mbụ n'ụwa iji belata ikuku methane sitere na anụ ụlọ na-eri anụ.[2]
Mgbasa ozi
dezieMootral dọtara uche dị ukwuu dị ka ónyé nkè abụọ na FT Global Climate Challenge na Dutch Postcode Lottery. [citation needed][3]
Mootral bụ ónyé ikpeazụ na Shell / BBC / Newsweek World Challenge 2009 dị ka otu n'ime ihe ngwọta iri na abuo kachasị mma màkà mgbanwe ihu igwe.[4]
Chris Sacca na Tribe Capital na-akwado Mootral.
Edensibia
dezie- ↑ 1.0 1.1 Satariano. "The Business of Burps: Scientists Smell Profit in Cow Emissions", New York Times, 1 May 2020.
- ↑ de Sousa. "Burping Cows Get the Green Light to Join Carbon-Offset Market", Bloomberg, 6 December 2019.
- ↑ Crooks. "The five fighters of climate change", Financial Times, 18 March 2009.
- ↑ Two UK projects in World Challenge 09 final. BBC World News.
Ebe e si nweta ya
dezie- https://web.archive.org/web/20230918082358/http://www.incropsproject.co.uk/documents/Events/Launch2009/David%20Wiliams%20Neem%20Biotech.pdf
- 2009 Finalist EMISSION CONTROL; United KINGDOM
- Animal Feed Science and Technology, Mpịakọta 147, Mbipụta 1-3, 14 Nọvemba 2008, Peeji 36-52
- Animal Feed Science and Technology, Mpịakọta 145, Mbipụta 1-4, 14 Ọgọst 2008, Peeji 351-363
- J. Dairy Sci 89:761-771, 2006