Montell Jordan
ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Njikota Obodo Amerika |
aha enyere | Montell |
aha ezinụlọ ya | Jordan |
aha pseudonym | Montell Jordan |
ụbọchị ọmụmụ ya | 3 Disemba 1968 |
Ebe ọmụmụ | Los Angeles |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee |
ọrụ ọ na-arụ | onye na-abụ abụ, singer-songwriter, onye na-emeputa ihe ndeko, rapper |
ebe agụmakwụkwọ | Pepperdine University, Junípero Serra High School |
oge ọrụ ya (mmalite) | 1994 |
ụdị olu | tenor |
ngwa egwu | olu egwụ |
diskografi | Montell Jordan discography |
Onye òtù nke | Kappa Alpha Psi |
ụdị | R&B dị ugbu a |
akara ndekọ | Def Jam Recordings |
webụsaịtị | https://montellandkristin.com |
Montell Du'Sean Barnett Jordan (amụrụ, na Disemba 3, 1968) bụ ónyé ụkọchukwu America, ónyé na-agụ egwu, ónyé na'ede egwu, na ónyé na-emepụta ihe ndekọ. A maara nke ọma màkà egwu ya nke 1995 "This Is How We Do It", Jordan bụ onye isi nwoke na-eme ihe nkírí na Def Jam's Def Soul ruo mgbe ọ hapụrụ akara ahụ na 2003.
N'afọ 2010, Jordan hapụrụ azụmahịa egwu iji bụrụ onye ndụ ofufe na Victory World Church na Norcross, Georgia.[1]
Mbido ndụ na agụmakwụkwọ
dezieA mụrụ Montell Jordan na South Central Los Angeles na Elijah na Deloris Jordan. A mụrụ ya n'ezinụlọ Baptist, Jordan gara ụka ya ugboro ugboro mgbè ọ bụ nwatakịrị, ebe nne ya na nnà ya rụrụ ọrụ dị ka dikọn. Ka ọ na-etolite, Jordan na-akpọ piano màkà ụka ya dị ka onye na-eti egwu. N'etiti afọ 1980, Montell gara Junipero Serra High School na Gardena California, yana Mahadum Pepperdine na Malibu, California, ebe ọ nwetara nzèrè bachelọ na nkwukọrịta.[2] Ọ ghọrọ onye otu Kappa Alpha Psi fraternity n'oge opupu ihe ubi nke afọ 1989. Jordan gụsịrị akwụkwọ na 1991.
Edensibia
dezie- ↑ Montell Jordan Leaving Entertainment Behind For Good?! Taking on the Ministry!. UrbLife.com (December 1, 2010).
- ↑ (2000) in Colin Larkin: The Virgin Encyclopedia of Nineties Music, First, Virgin Books. ISBN 0-7535-0427-8.