Mertlene Perkins
Akụkụ nke | Quilts of Gees Bend Alabama |
---|---|
ụdịekere | nwanyị |
mba o sị | Njikota Obodo Amerika |
aha ezinụlọ ya | Perkins |
ụbọchị ọmụmụ ya | 1917 |
Ebe ọmụmụ | Gastonburg |
Ụbọchị ọnwụ ya | 2015 |
ọrụ ọ na-arụ | onye ese, quiltmaker |
agbụrụ | Ndi Afrika nke Amerika |
onye nnọchite anya nwebiisinka | ikike mmeputakwa nke CISAC-otu nọchiri anya ya |
Nwere ọrụ na mkpokọta | Metropolitan Museum of Art |
ikike nwebiisinka dị ka onye okike | Ọrụ nwebiisinka chekwara |
Mertlene Perkins (1917-2015) bụ ónyé America na-ese ihe. A na-ejikọta ya na ndị otu Gee's Bend quilting collective.[1][2] E gosipụtara ọrụ ya na Museum of Fine Arts, Houston ma tinye ya na nchịkọta nké Metropolitan Museum of Art.[3][4]
Oge ọ malitere
dezieNné na nnà Perkins bụ Maggie Tripp na Isom Martin, n'otu n'otu. Nne ya bụ ónyé ọrụ ugbo na nnà ya na-arụ ọrụ n'ọdụ ụgbọ okporo ígwè. Ọ hụrụ ya n'anya ịnọnyere nne ya, ya mèrè ọ malitere inyere aka n'ugbo ahụ n'oge ọ nwèrè ike, ihe dị ka afọ asatọ. Ha na-azụkarị ogho, ahụekere ọka, na poteto.[3]
Ọ gàrà ụlọ akwụkwọ afọ itoolu na Prairie, Alabama Ọ lụrụ Herman Perkins mgbè ọ dị afọ iri na itoolu. Ha zụlitere ụmụ iri na abụọ ọnụ, itoolu n'ime ha dị ndụ ruo mgbè ha toro.[3]
Ọrụ
deziePerkins mụtara ịkpa ákwà n'aka nne ya na nné nne ya. Quilting bụ ihe na-atọ Perkins ụtọ. N'ịgbaso omenala nke Gee's Bend improvisation style, ọ na-ekwu na "M na-eme akwa nke m. Anaghị m eso echiche ónyé ọ bụla ma e wezụga nke m. "[3]
Edensibia
dezie- ↑ Beardsley (2002). Gee's Bend: The Women and Their Quilts (in en). Tinwood Books. ISBN 9780971910409.
- ↑ Arnett (2006). Gee's Bend: The Architecture of the Quilt (in en). Tinwood Books. ISBN 9780971910478.
- ↑ 3.0 3.1 3.2 3.3 Mertlene Perkins | Souls Grown Deep Foundation. www.soulsgrowndeep.org. Retrieved on 2019-04-22.
- ↑ Mertlene Perkins | Birds in Flight quilt. www.metmuseum.org. Retrieved on 2019-04-22.