Matthew Blaise

Onye na-akwado ikike ikike Naijiria
Matthew Blaise
Mmádu
ụdịekerenon-binary Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereMathew Dezie
aha ezinụlọ yaBlaise Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1990s Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụactivist Dezie
ebe agụmakwụkwọAlex Ekwueme Federal Univesity, Ndufu-Alike Ikwo Dezie
Ọmụma Mmekọahụnwoke idina nwoke Dezie
nnọchiaha nkeonweL371 Dezie

Matthew Nwozaku Chukwudi Blaise[1] bụ onye Naijiria na-ahụ maka ikike na nkwuchite ọnụ ndị ndịna nwanyị.

N'ọnwa Machị afọ 2020, mgbe e gbusịrị nwoke na-edina nwoke na Naịjirịa, Blaise mepụtara mgbasa ozi Twitter tinyere Ani Kayode Somtochukwu na Victor Emmanuel. Mmadụ atọ ahụ nwere ihe ịga nke ọma na mmepụta hashtag "#EndHomophobiainNigeria" na Twitter Naijiria ruo ọtụtụ ụbọchị.

N'ịbụ onye ndị ọrụ Special Anti-Robbery Squad jidere ma yie ya egwu maka "mmekọ nwoke idina nwoke", Blaise malitere ịrụsi ọrụ ike na ngagharị iwe nke ọnwa Ọktoba afọ 2020 nke End SARS, ebe a wakporo ha maka ibu ihe ngosi nke edere okwu "Queer Lives Matter".[2] Ha kwadokwara otu ndị ọzọ na-eme ngagharị iwe ahụ.[1]

Mgbe ọgbugba egbe nke Lekki n'afọ 2020 gasịrị, Blaise malitere ịrụ ọrụ na Safe HQuse iji kwado ndị na-eme ngagharị iwe na ndị lanarịrị.[2]

Ndụ onwe onye dezie

Blaise adighibabụọ, ma ọ na-eji nnochiaha ha / ha. Ka ọ na-erule Ọktọba , ha na-aga Alex Ekwueme Federal University Ndufu Alike Ikwo na Naịjirịa, na-agụ gbasara Bachelor of Arts na English na Literary Studies.[3][4]

Blaise bịara n' ekewapụ okwu n'ezoghị ọnụ banyere mmekọahụ ha na soshal midia mgbe otu onye ụkọchukwu kuru ha ọkpọ ma kpagbuo ha maka ịbụ nwoke n'edina nwoke n'afọ 2019, ndị ọzọ nọ na chọọchị ahụ etinyeghị aka.[1]

Ọmụma dezie

Blaise bụ onye ndu ndị ntorobịa Women Deliver N'afọ 2020; ha dị afọ iri abụọ na abụọ n'oge ahụ.[4] Nakwa n'afọ 2020, ha bụ ndị mmeri nke The Future Awards Africa "Prize for Leading Conversations", na The Initiative for Equal Rights' award for "SOGIESC Rights Activist of the Year".[5][6]

N'ọnwa June n'afọ 2021, e gosipụtara ha na obere ihe nkiri nke Dafe Oboro nke so na akụkọ mkpuchi oge okpomọkụ 2021 nke Dazed .[7] N'ọnwa Nọvemba afọ 2021, e nyere ha "Generation Change Award" na 2021 MTV Europe Music Awards na Budapest.[8]

Ihe edeturu dezie

 

Edensibia dezie

  1. 1.0 1.1 1.2 Greenfield (March 11, 2021). LGBTQ Rights Regress in Unexpected Places Yet Advance in Others. Bloomberg. Retrieved on 2021-06-06.
  2. 2.0 2.1 Smith (2020-10-21). End SARS: Queer Nigerians are being abused, humiliated and killed by a corrupt police unit – and it's nothing new (en-GB). PinkNews. Retrieved on 2021-06-06.
  3. Blaise (2020-10-13). Queer Nigerians Are Being Beaten by SARS — I'm Trying to End That (en). Out. Retrieved on 2021-06-06.
  4. 4.0 4.1 Matthew (Blaise) Nwozaku (en-US). Women Deliver (2020). Retrieved on 2021-06-06.
  5. The Future Awards Africa: Class of 2020 (en-GB). The Future Awards Africa (2020-11-08). Archived from the original on 2021-10-24. Retrieved on 2021-06-06.
  6. Obi-Young (2020-12-26). The 2020 Freedom Awards Honour LGBTQ & Feminist Advocates (en-US). Open Country Magazine. Retrieved on 2021-06-06.
  7. Dawson (2021-06-03). Meet the resilient Nigerians leading the country's youth revolution (en). Dazed. Retrieved on 2021-06-06.
  8. Ramachandran. "As MTV EMAs Go Ahead in Budapest Despite Anti-LGBTQ Laws, Hungarian Activist Award Winner Details ‘Fear and Censorship’", Variety, 2021-11-14. Retrieved on 2021-11-15.