Margarita Darbinyan

Margarita Darbinyan-Melikyan (Armenian; 18 Machị 1920 - 9 Machị 2021) bụ onye Armenia na-akọ akụkọ ihe mere eme ya na onye nsụgharị.

Akụkọ ndụ

dezie

A mụrụ Margarita Darbinyan na Machị 18, afọ 1920, na Batum, Georgia SSR. Nna ya bụ onye Katọlik Armenia, na nne ya bụ onye Katọlik Polish. Nne na nna ya abụọ maara Russian, mana ọ dịghị onye na-asụ asụsụ Armenian na Polish. A zụlitere Margarita na-asụ Russian n'ụlọ, na-amụta asụsụ Armenian site na klassika Armenian. N'afọ 1941, Margarita Darbinyan gụsịrị akwụkwọ maka nkuzi na ụlọ akwụkwọ Moscow. Mgbe ọ laghachiri Armenia, a họpụtara ya ịrụ ọrụ na Chibukhlu (nke bụzi Tsovagyugh). N'afọ 1951, ọ malitere ịkụzi na ụlọ akwụkwọ Yerevan nke ndi Russian asụsụ mba ọzọ, ọ ghọrọ onye nchọpụta dị elu na ụlọ akwụkwọ maka aguma akwụkwọ Oriental n'afọ 1958, na Matenadaran n'afọ 1959.

Margarita gụrụ akwụkwọ ma sụgharịa isi mmalite nke akụkọ ihe mere eme nke Armenia site na klassicka Armenian gaa na Russian ma mee ntụaka. Ọ chịkọtara ederede mbụ nke akwụkwọ Tovma Artsruni akporo History of the House of Artsruni ma dee okwu mbido na ntụaka. Ọ sụgharịrị n'asụsụ Armenian site n'ọtụtụ asụsụ gụnyere Persian, German, English, French, Italian, na Arabic.

Darbinyan nwụrụ na Yerevan na 9 Machị afọ 2021, mgbe ọ dị afọ nari.[1]

Ihe odide

dezie