Margaret Ladipo
Margaret Kudirat Ladipo (a mụrụ n'abali iri-na isii n’onwa Eprel nke afọ 1961) bu onye akwukwo na onye nchoputa nke Naijiria nke jere ozi dika Rektọ nke Yaba College of Technology site n’afọ 2009 rue n'afọ 2017. [1]
Mmalite ndu na mmuta
dezieMargaret bụ onye Kwara steeti ma a mụrụru ya na Kaduna, dị na Kaduna State, nke Naijirịa. Ọ gụsịrị agụmakwụkwọ ụlọ akwụkwọ praịmarị na nke ụlọ akwụkwọ sekọndrị na Anglican Girls School, Kaduna na Government Secondary School, Kaduna n'otu n'otu. [2]
Margaret nwere asambodo B.Sc na kemistri, asambodo M.Sc na Polima Sayensị na Tekịnụzụ yana Ph.D na nyocha kemistri na Mahadum Ahmadu Bello . [2]
Ọrụ
dezieỌrụ Margaret Ladipo hụrụ na mgbe mbụ ọ nwetara ọrụ dị ka onye enyemaka gụsịrị akwụkwọ na Mahadum Ahmadu Bello n'afọ 1982 tupu ọ gawa ọrụ dị ka Lecturer III na Kaduna Polytechnic n'afọ 1984. [3] N’afọ 1986, ọ banyere na Yaba College of Technology dịka Lecturer II ebe ọ gbagoro n’ọkwa were bụrụ onye isi ndi nkuzi n’afọ 2002. Tupu a họpụta ya dị ka Rektọ, ọ rụrụ ọrụ dị ka onye njụ ụlọ ọrụ kọleji hụ. [3]
Margaret e deela akwụkwọ abụọ ma bipụta ọtụtụ ederede na akwụkwọ akụkọ mpaghara obodo na mba ụwa. Ọ bụ onye otu Institute of Operations Research nke Naijirịa, Civil Institute of Democratic Administration na Institute of Investment Management and Research. [3]
Ihe ojo
dezieN'ime ọchịchị ya, e boro Margaret ebubo "i zo ego" na "i zu ego" nke e wepụtara maka mwulite Yaba College of Technology. [4] [5]
Ebemsidee
dezie- ↑ "Teacher’s education our top priority – Yabatech Rector", Vanguard Newspaper, 21 January 2016. Retrieved on 24 May 2016.
- ↑ 2.0 2.1 LAGOS CHAPTER (YABATECH). Archived from the original on 23 June 2016. Retrieved on 24 May 2016.
- ↑ 3.0 3.1 3.2 Yaba College of Technology gets a New Rector. Archived from the original on 21 April 2016. Retrieved on 24 May 2016.
- ↑ Nicholas Ibekwe. "Exclusive: Yabatech Rector in multi-million Naira fraud", Premium Times, 6 May 2013. Retrieved on 24 May 2016.
- ↑ "Millions Looted From Treasury Of Yaba College of Technology", Sahara Reporters, 25 February 2014. Retrieved on 24 May 2016.