Mangala Sharma (amụrụ afọ 1969 [1] na Tsirang, Bhutan ) bụ onye na-akwado ikike mmadụ na ụmụ nwanyị na onye mmeri mbụ nke ihe nrite ego Ginetta Sagan n'afọ 1997. [2] A chụpụrụ ya na mba ahụ na Machị afọ 1992 [lower-alpha 1] mgbe o kwuchara okwu megide iwu gọọmentị "Otu Mba, Otu Ndị mmadụ" na ịkpa ókè ha na-emegide ndị agbụrụ nta, nke a maara dị ka Lhotshampas . [3] Kemgbe ọ chụgara n’ala ọzọ, ọ kpụrụla ọgbakọ Bhutanese Refugees Aid for Victims of Violence (BRAVE), ọgbakọ na-enyere onwe ya aka maka inyere ndị gbara ọsọ ndụ sitere na Bhutan aka. BRAVE na-akwado ndụmọdụ na ọzụzụ n'ime ogige ndị gbara ọsọ ndụ Bhutanese asatọ na Nepal . [2] N'afọ 1995 Sharma kpọọrọ ụfọdụ ndị inyom gbara ọsọ ndụ na Beijing, China gaa na Nzukọ Ndị Inyom International. N'ebe ahụ, ọ nwetara enyemaka site n'aka gọọmentị United States, United Nations na Gọọmenti Australia . [4]

E nyere Sharma mgbapu wee kwaga ya obodo United Steeti n'afọ 2000 wee malite ịrụ ọrụ maka ike ama dika Refugee Women Network nke dabeere na Georgia. Ọ kwagara obodo Roseville, Minnesota na ọnwa Nọvemba afọ 2007, ebe ọ malitere ihe ama dika Nirvana Center nke na-enyere ezinaụlọ ebigharịrị aka. [3]

Hụkwa

dezie
  • Ihe ndị ruuru mmadụ na Bhutan
  • Ụmụ nwanyị na Bhutan

Ihe odide

dezie
  1. Gold (5 February 2013). The Tao of Mom: The Wisdom of Mothers from East to West. Andrews McMeel Publishing. ISBN 978-0-7407-8743-0. 
  2. 2.0 2.1 Ginetta Sagan Award Winners. Amnesty International. Retrieved on 26 April 2014.
  3. 3.0 3.1 Mangala Sharma. From Exile to Resettlement. Retrieved on 26 April 2014. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "Exile" defined multiple times with different content
  4. Born in Bhutan and exiled