Mahadum Comilla
Mahadum Cumilla (Templeeti:Lang-bn) bụ mahadum gọọmenti nwere dị na Kotbari, Cumilla, Bangladesh.[1] A rụrụ mahadum a n'obosara àlà dị ékà 244.19 na Shalban Vihara, Moynamoti.[2] Mahadum Cumilla nwere nhuku na University Grants Commission, Bangladesh.
Golam Mowlah bụ onye isi Mahadum mmalite nke Mahadum Cumilla onye jere ozi ruo mgbe e wepụrụ ya na 30 Julaị 2008. E duru Zulfikar Ali, okammụta n'isi ọmụmụ mgbakọ na mwepụ, n'iyi ọrụ dị ka onye isi mahadum nwa oge. [3] Onye isi Mahadum Cumilla nochiri, A.K.M. Zehadul Karim kwupụtara arụkwaghịm ya na 7 Ọktoba 2009. [4] A họpụtara Amir Hossen Khan, okammụta na ngalaba Physics nke Mahadum Jahangirnagar, dị ka onye isi mahadum n'ala iri abụo na abụo nke oọnwa Nọvemba 2009. Mgbe ógè ọchịchị Amir Hossen Khan gasịrị, ahọpụtara Dr. Ali Ashraf, onye bụ okammụta na ngalaba nchịkwa Akụnaụba nakwa onye bụbu onye isi oche Òtù Ndị Nkụzi na Mahadum Chittagong dịka onye isi mahadum nke ise nke Mahadum Cumilla. O sonyeere mahadum ahụ na 3 Disemba 2011. Professor Dr. Emran Kabir Chowdh sonyeere dịka onye isi mahadum nke isii nke mahadum Cumilla na Jenụwarị 31, 2008.
llor na 22 Nọvemba 2009.[5] Mgbe oge nke Amir Hossen Khan mgbe ahụ Dr. Ali Ashraf gwụsịrị, a họpụtara prọfesọ nke ngalaba akụ na ụba na onye bụbu onye isi oche nke Chittagong University Teachers Association dị ka onye isi oche ise nke Mahadum Cumilla. Ọ sonyeere mahadum na 3 Disemba 201. Prọfesọ Dr. Emran Kabir Chowdhury na Jenụwarị 31, 2018 sonyeere dị ka osote onye isi nke isii nke Mahadum Cumilla.[6]
Ọ malitere n'ime ngalaba asaa na-arụ ọrụ. Ugbu a enwere ngụkọta ngalaba nke dị iri na itoolu n'okpuru ngalaba nnukwu ọmụmụ isii gụnyere Information & Communication Technology, Computer Science & Engineering, Pharmacy, Physics, Chemistry, Statistics, Mathematics, Finance and Banking, Accounting & Information Systems, Marketing, Management Studies, Mass Communication & Journalism, Law, Economics, Public Administration, Archeology, Anthropology, Bengali, na English.
Nchịkwa
dezie- Onye isi nke onye isi mahadum: Maazị Mohammed Shahabuddin (Onye isi ala nke People's Republic of Bangladesh)
- Onye isi oche mahadum: Prọfesọ Dr. A. F. M. Abdul Moyeen
- Onye osote onye isi oche mahadum: Prọfesọ Dr. Mohammad Humayun Kabir
- Onye njikwa akụ: Prọfesọ Dr. Md. Asaduzzaman
- Onye na-edebanye aha: Prọfesọ Dr. Md Abu Taher
Ndị isi oche Mahadum ahụ Kemgbe afọ 2006
dezie- Golam Mowlah (26 Julaị 2006 - 30 Julaị 2008)
- M. Zulfikar Ali (31 Julaị 2008 - 19 Ọktoba 2008)
- A. H. M. Zehadul Karim (20 Ọktoba 2008 - 22 Nọvemba 2009)
- Md. Amir Hossen Khan (23 Nọvemba 2009 - 22 Nọvembre 2013)
- Md. All Ashraf (3 Dec 2013 - 2 Dec 2017)
- Emran Kabir Chowdhury (31 Jenụwarị 2018 - 30 Jenụwarụ 2022) [7]
- A. F. M. Abdul Moyeen (31 Jenụwarị 2022 - ruo ugbua) [8]
Na nlereanya otu mgbe
dezieMpaghara Ngụkọta | 244.19 Acre |
Nraranye | 8 Febụwarị 2006 |
Ntọala | 28 Mee 2006 |
Klas Malite | 28 Mee 2007 |
Ngalaba mmeghe |
|
Ihe omuma | 6 |
Ngalaba Ndị Dị Ugbu a | 19 |
Ngalaba sayensị |
|
Ngalaba sayensị mmekọrịta mmadụ na ibe ya |
|
Ngalaba nke nka na Humanities |
|
Ngalaba nke Ọmụmụ Azụmaahịa |
|
Ngalaba Injinịa |
|
Ngalaba Iwu |
|
Ọnụ ọgụgụ ụmụ akwụkwọ | 7055 |
Ndị otu ngalaba | 272 |
Ndị uwe ojii | 92 |
Ndị ọrụ | 185 |
Akụkọ ihe mere eme
dezieKọmitii ezege maka akụ na ụba nke mba (ECNEC) kwadoro ọrụ maka iguzobe mahadum sayensị na teknụzụ dị iri na abụọ na mba ahụ n'afọ 2001 ma mee atụmatụ ka e guzobe otu n'ime ha na Cumilla. Mana kama nke ahụ, gọọmentị nyere mahadum n'ozuzu ya na akwụkwọ ikike ya na Cumilla na 8 Mee 2006, dị ka mahadum ọha na eze gọọmenti nwere nke iri abụọ na isii ya nke mahadum ahụ na-arụ ọrụ n'okpuru ya.
Mahadum ahụ malitere njem ya kpọmkwem na 28 Mee 2007, site na mmemme ntụziaka maka afọ agụmakwụkwọ 2006-07 nke ụmụ akwụkwọ narị atọ na ndị nkuzi iri na ise d
debanyere aha na ngalaasaaadị 7 n'okpuru ngalannukwu ọmụmụ ba anọ:
- Ngalaba nke mgbakọ na mwepụ n'okpuru nnukwu ngalaba sayensị,
- Ngalaba Bekee n'okpuru nnukwu ngalaba Arts & Humanities,
- Ngalaba akụ na ụba na nchịkwa ọha na eze n'okpuru nnukwu ngalaba sayensị mmekọrịta mmadụ na ibe ya.
- Ngalaba atọ (Accounting & Information Systems, Management, Marketing) n'okpuru School of Business.
E webatara Ngalaba Sayensị Kọmputa na Injinịa (CSE) n'afọ ọmụmụ akwụkwọ 2008-09. E webatara Ngalaba Bangla, Ngalaba Anthropology na Ngalaba Nformation and Communication Teknụzụ (ICT) n'afọ ọmụmụ akwụkwọ 2009-2010. E megheela ngalaba atọ ọhụrụ (Fiziks, Kemistri na Statistiks) n'afọ ọmụmụ akwụkwọ 2010-2011. Site n'afọ ọmụmụ akwụkwọ 2013-14, ewebatalakwa ngalaba atọ ọzọ (Finans na Bankin, Famasi na Akịọlọji). Mahadum Cumilla nwere ihe karịrị puku ụmụ akwụkwọ anọ n'ìgwè dị iche iche, ndị nkuzi otu narị na ịrị abụọ na ndị ọrụ otu narị ọzọ ndị raara onwe ha nye iduzi nkuzi na ime nnyocha.
Gbasara Agụmakwụkwọ
dezieNgalaba na nnukwu ngalaba
dezieNkụzi | Ngalaba | oche |
---|---|---|
Ngalaba Injinịa | Sayensị Kọmputa na Injinia | 50 |
Teknụzụ ozi na nkwurịta okwu | 50 | |
Ngalaba sayensị | mgbakọ na mwepụ | 60 |
Physics | 50 | |
Chemistry | 50 | |
Ndekọ ọnụ ọgụgụ | 50 | |
Ụlọ ọgwụ | 40 | |
Ngalaba nke Iwu nka | Iwu | 50 |
Ngalaba nke Arts & Humanities | Bangla | 60 |
Bekee | 60 | |
Ngalaba sayensị mmekọrịta mmadụ na ibe ya | Ọnọdụ akụ na ụba | 60 |
Mgbasa Ozi na Mgbasa ozi | 50 | |
Nchịkwa Ọchịchị | 60 | |
Nkà mmụta ihe ochie | 50 | |
Anthropology | 60 | |
Ngalaba Azụmaahịa | Nnyocha Nchịkwa | 60 |
Ahịa | 60 | |
Usoro ndekọ ego na usoro ozi | 60 | |
Ego na Ụlọ Akụ̀ | 60 |
Ụlọ ndị ewuru maka agụmakwụkwọ
dezieE nwere ụlọ agụmakwụkwọ anọ (Otu ka a na-arụ ugbua) na Mahadum Cumilla
- Ụlọ agụmakwụkwọ 1 (North) (Faculty of Business Studies)
- Ụlọ agụmakwụkwọ 2 (South) (Faculty of Social Science, Arts)
- Ụlọ agụmakwụkwọ 3 (Faculty of Science)
- Ụlọ agụmakwụkwọ 4 (Faculty of Law and Engineering)
Ụlọ obibi ụmụ akwụkwọ
dezieE nwere ụlọ obibi ise. Abụọ maka ụmụ akwụkwọ nwanyị na atọ maka ụmụ akwụkwọ nwoke (otu ụlọ obibi ụmụ akwụkwọ nwanyị ka na-aga n'ihu).
- Ụlọ obibiShaheed Dhirendranath Datta
- Ụlọ Obibi Alakụba Kazi Nazrul
- Ụlọ Obibi Bangabandhu Sheikh Mujibor Rahman
- Ụlọ obibi Nawab Faizunnesa Choudhurani (Nwanyị)
- Ụlọ obibi Sheikh Hasina (Nwanyị)
Hụkwa
dezie- Ndepụta nke ụlọ akwụkwọ agụmakwụkwọ dị na Cumilla
Edensibia
dezie- ↑ Cumilla University. University Grants Commission. Archived from the original on 16 November 2017. Retrieved on 6 November 2017.
- ↑ "Foundation stone of Cumilla University laid".
- ↑ "Cumilla Univ vice-chancellor removed", New Age, 31 July 2008.
- ↑ Template error: argument title is required.
- ↑ Template error: argument title is required.
- ↑ "Professor Dr. Emran Kabir Chowdhury, New-Cumilla-University-Vice-Chancellor-takes-office", Daily Sun, 31 January 2018.
- ↑ Correspondent (2018-01-31). Prof Amran Cumilla University VC (en). The Daily Star. Retrieved on 2022-04-26.
- ↑ Report (2022-01-16). Prof Abdul Moyeen appointed Cumilla University VC (en). The Daily Star. Retrieved on 2022-04-26.
Njikọ mpụga
dezie- Ebe nrụọrụ weebụ gọọmentị