Luca Desiata (amụrụ na Disemba 10, 1971) bụ onye njikwa Ịtali, Latinist na onye nhazi nka. Ọ bụ Onye isi oche nke SOGIN n'etiti afọ 2016 ruo 2019. Ọ bụ onye guzobere na Onye isi nchịkọta akụkọ nke magazin Latịn crosswords Hebdomada Aenigmatum na nke magazin crosswords na Ancient Greek Onomata Kechiasmena. Ọ bụ onye nlekọta nke Corporate Art Awards.

Asụsụ Ndị Ochie dezie

O guzobere Hebdomada Aenigmatum na June 2014 n'okpuru aha nzuzo nke Lucas Cupidus na Onomata Kechiasmena na May 2015 na aha Λουκīς Δεσιάτα.

Ọ haziri ọtụtụ ihe omume maka ụmụ akwụkwọ na ndị ọkachamara, iji kwalite ojiji nke Latin na Grik oge ochie na ọha mmadụ nke ugbu a: Certamen Aenigmatum Latinorum mbụ (Latin Enigmatic Olympiad[1][2]) na X oge n-ememe nke ndi Européen Latin-Grec na École normale supérieure de Lyon; nzukọ ọmụmụ ihe "azumahia Latin - okwu ndi latin maka onye njikwa ogbara ohuhu maka njikọ nke ndị isi Enel;[3] ọtụtụ ngosi banyere "Latin in the Internet age", nke abụọ n'ime ha na 2017 na Scuola Normale Superiore di Pisa.[4]

Na Disemba 5, 2016 na Rom, ọ bịanyere aka na nkwekọrịta nghọta na Ministri Mmụta nke Ịtali iji kwalite ojiji nke Latin na Greek crosswords dị ka ngwá ọrụ iji mee ka ịmụ asụsụ oge ochie dị mfe.

N'okpuru nkwado nke Ministry of Culture nke Ịtali, na 2016 ọ haziri mbipụta mbụ nke "Corporate Art Awards", na ebumnuche ịmata ọrụ nka kachasị mma nke Corporate World. [5] [6][7]

Na mbiputa 2017 oke nke onyinye na ulo oru agbasara gunyere ndi ulo oru mbalile kwa..Ya mere a ji kpoghari aha mmeme ahu Mecenati of the XXI century”.[8][9][10] omume nturu ugo afo (2017)bu onye isi ndi Italian republic kwadoro ya Sergio Mattarella na Quirinal Palace.[11]

N'afọ 2015, Desiata haziri ihe ngosi Corporate Art na Galleria Nazionale d'Arte Moderna na Rom .[12][13][14]

Ọ bụ prọfesọ nke Corporate art na LUISS Business School n'etiti afọ 2014 na 2016. N'afọ 2014, o guzobere pptArt, ebe nrụọrụ weebụ mbụ na-emepụta ihe osise. [15][16]

N'ọnwa Julaị afọ 2016, a họpụtara ya ka ọ bụrụ onye isi oche nke SOGIN, ụlọ ọrụ gọọmentị Ịtali nke na-ahụ maka ịkwụsị ụlọ ọrụ nuklia ndị Ịtali. N'ọnwa Septemba n'afọ 2017, o zigara usoro mmebi nke nuklia nke Ịtali na nyocha nke ndị ọgbọ nọọrọ onwe ha nke International Atomic Energy Agency .[17]

Site na 1995 ruo 2002 ọ rụrụ ọrụ na Procter & Gamble, Accenture na Bain. Site na 2002 ruo 2006, ọ sonyeere World Bank na Belgrade dị ka onye ndụmọdụ na Private Agency nke Republic of Serbia. Site na 2006 ruo 2016 ọ rụrụ ọrụ dị iche iche na Enel. O nwere akara ugo mmụta injinia na Mahadum Pisa, diplọma na Sant'Anna School of Advanced Studies na Pisa na MBA na Insead Business School.

E nyere ya nsọpụrụ mba Ịtali nke Knight of the Order of the Star of Italian Solidarity na 2006. [18]

Forbes gụnyere ya na ndepụta ndị Itali nke ndị njikwa mmeri 2019. N'ọnwa Mee afọ 2018 ọ nọ n'ọnọdụ nke iri abụọ na anọ na TopManager's reputation ranking of Italian top managers.

Ọ bụ onye dere "Scacchi e stratégie aziendali" (Chess and Corporate Strategy) ya na Anatoly Karpov, onye mmeri nke iri na abụọ nke ụwa, na Rocco Sabelli, onye bụbu Ceo nke Alitalia.

  1. Ecole Normale Supérieure de Lyon - Conférences, lectures et visite virtuelle de la Rome antique. Archived from the original on 25 April 2016. Retrieved on 18 February 2018.
  2. PRIMAE OLYMPIADES AENIGMATUM LATINORUM.
  3. DE LINGUA LATINA MERCATORIA.
  4. Digital Latin: "Il latino nell'era di Internet" (12 May 2015).
  5. Assegnati i Corporate Art Awards 2016: "Italia torna capitale del mecenatismo" (23 November 2016). Archived from the original on 8 February 2018. Retrieved on 13 May 2024.
  6. Петракова (26 November 2016). Премию Corporate Art Award вручили фонду Потанина.
  7. Pirrelli (26 November 2016). A Deutsche Bank il Corporate Art Awards.
  8. Museo Numismático del Ecuador fue nominado para los premios "Institutional Art Awards" (6 September 2017). Archived from the original on 2 February 2018. Retrieved on 13 May 2024.
  9. Al gruppo Intesa Sanpaolo il premio speciale per i mecenati (22 November 2017).
  10. Più mecenati tra le imprese: a Ferragamo e Generali il premio Art bonus (22 November 2017).
  11. Il Presidente Mattarella ha ricevuto i partecipanti al Convegno "Mecenati del XXI secolo" (22 November 2017).
  12. Companies display their art in GNAM museum exhibit (26 June 2015). Archived from the original on 24 April 2016. Retrieved on 13 May 2024.
  13. Ministero dei beni e delle attività culturali e del turismo:Corporate Art. L'azienda come oggetto d'arte.
  14. Alla Gnam "Corporate Art", la mostra tra business e creatività (5 May 2015).
  15. Maci (2 May 2014). È italiana la prima startup di crowdsourcing per l'arte.
  16. Luca Desiata e pptArt, quando l'arte incontra il crowdsourcing (31 July 2015). Archived from the original on 16 October 2017. Retrieved on 13 May 2024.
  17. L'ONU promuove Sogin sul nucleare (20 September 2017).
  18. Desiata Ing. Luca: Cavaliere dell'Ordine della Stella d'Italia (già Stella della solidarietà italiana). Presidenza della Repubblica.