Kwizera Eudia
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịUganda Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya5 Disemba 2017, 2017 Dezie
Ebe ọ nwụrụNsambya Hospital Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịNational Resistance Movement Dezie

Kwizera Eudia bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na onye ọrụ mmekọrịta ọha na eze nke Uganda. Onye otu National Resistance Movement (NRM), ọ rụrụ ọrụ na Nzukọ Ndị Omeiwu nke asatọ nke Uganda na-anọchite anya Kisoro District.[1][2]

Agụmakwụkwọ dezie

O nwere asambodo na nzere bachelọ na ndụmọdụ.[3]

Ndụ ọrụ tupu ọnwụ dezie

Ọ nwụrụ na afọ 2017 mgbe ọ dị afọ 60 site na Ụlọ Ọgwụ Nsambya na Kampala.[4][5][6] E kwuru na Kwizera nwụrụ mgbe ọ rịasịrị obere ọrịa.[1] Tupu ọnwụ ya, ọ rụrụ ọrụ dị ka nwanyị so na ndị omeiwu nke asatọ nke Uganda maka Kisoro District site na afo 2006 ruo na afọ 2011 tupu Sarah Mateke Nyirabashitsi, nwa nwanyị nke Minista Steeti, Philemon Mateke ewere ya dị ka onye omeiwu nke Kisoro District.[3] E liri Kwizera n'ụlọ nna nna ya na R Bugiru Town Council na Kisoro District.[3]

Tupu ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya, ọ rụkwara ọrụ dị ka onye na-akwalite ndị mmadụ na Compassion International.[3] Ọ bụ onye otu Executive Board na African Queens na Women Cultural Leaders Network.[3] Eudia, nwere naanị otu nwa nwoke aha ya bụ Michael Kwizera.[3]

N'oge nzukọ ndị omeiwu Afrịka na Kenya, ọ gbara ndị isi Afrịka ume ka ha hụ na mmepụta nri dị mma yana nhazi na ahịa.[7]

Hụkwa dezie

  • Sarah Mateke Nyirabashitsi
  • Ndepụta nke ndị otu nke asatọ nke Nzukọ Ndị Omeiwu nke Uganda

Ebenside dezie

  1. 1.0 1.1 Ex-NRM Kisoro MP dies after a short strange illness. The Local Uganda (2017-05-12). Retrieved on 2022-03-23.
  2. Kisoro NRM supporters promise Museveni win (en). Monitor (2021-02-02). Retrieved on 2022-03-23.
  3. 3.0 3.1 3.2 3.3 3.4 3.5 Ex- Kisoro MP Eudia Kwizera Dead. ChimpReports (2017-05-13). Retrieved on 2022-03-23.
  4. Former MP Eudia Kwizera is Dead. Uganda Radionetwork. Retrieved on 2022-03-23.
  5. Kisoro Leaders Mourn Former MP Eudia Kwizera : (en). Uganda Radionetwork. Retrieved on 2022-03-23.
  6. Former Kisoro woman MP Kwizera passes on. New Vision. Retrieved on 2022-03-23.
  7. Invest in food crops, Africa told. nation.africa. Retrieved on 2022-03-23.