Khanyisile Litchfield-Tshabalala
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | South Africa |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee |
ọrụ ọ na-arụ | Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị |
Ọkwá o ji | member of the National Assembly of South Africa |
ebe agụmakwụkwọ | University of Cape Town |
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị | Economic Freedom Fighters |
ọkwa agha | admiral |
kọwara na URL | https://www.pa.org.za/person/khanyisile-litchfield-tshabalala/ |
Khanyisile Litchfield-Tshabalala bụ onye bụbu onye isi ndị agha mmiri mba South Africa. O mechara bụrụ onye omeiwu maka Economic Freedom Fighters.[1]
Mbido ndụ na agụmakwụkwọ
dezieA mụrụ ya na Soweto[2] ma mesịa sonye na Umkhonto we Sizwe na Angola. Mgbe ọ laghachiri South Africa, ọ gụsịrị akwụkwọ na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ihe nkiri na Mahadum nke Cape Town na nzere nsọpụrụ na criminology.[2]
Ọrụ ụgbọ mmiri
dezieỌ sonyeere ndị agha mmiri South Africa na 1 Eprel, na afọ 1997 wee bụrụ nwanyị mbụ e buliri n'ọkwa Rear Admiral (Junior Grade) mgbe ọ malitere ọrụ nke Director Fleet Force Human Resources na Fleet Command na 1 Jenụwarị na afọ 2004.[2][2] O mechara gbaa arụkwaghịm mgbe ụlọ ikpe ndị agha mara ya ikpe maka ịkọ akụkọ aghụghọ banyere izu ohi laptọọpụ. A chọtabeghị laptọọpụ furu efu ma ọ gọnahụrụ na ọ chepụtara ohi ahụ.[3]
Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị
dezieỌ banyere na ndị omeiwu dị ka onye otu EFF na-esote ntuli aka nke afọ 2014.[4]
Na 3 Juun, na afọ 2015 ọ sonyeere United Democratic Movement (UDM), ma nye ya ọrụ ozugbo dị ka onye nhazi mba. N'ọnwa Disemba afọ 2015, a họpụtara ya dịka osote onye isi oche nke UDM. Na ngwụcha Septemba na afọ 2016, ọ hapụrụ UDM, na-ekwu na ọ chọrọ ịga n'ihu na agụmakwụkwọ, mana ndị na-akọwa ihe na-ekwu ete ya na Holomisa sere okwu.[5]
Ebenside
dezie- ↑ 2014 elections: List of EFF MPs elected to the National Assembly. Politicisweb.co.za (May 17, 2014). Retrieved on October 6, 2014.
- ↑ 2.0 2.1 2.2 2.3 Welcome aboard, Admiral Khanyi. IOL (August 8, 2003). Retrieved on October 6, 2014.
- ↑ Navy admiral quits after laptop fraud. Defenceweb (March 19, 2009). Retrieved on October 6, 2014.
- ↑ 2014 elections: List of EFF MPs elected to the National Assembly - DOCUMENTS | Politicsweb. www.politicsweb.co.za. Retrieved on 19 April 2018.
- ↑ Nini. "Deputy president dumps UDM as infighting claims surface", DispatchLIVE, 22 September 2016. Retrieved on 19 April 2018.