Kejok (onye akụkọ ifo)

Kejok bụ onye dike n'akụkọ ifo n'okpukpe ọdịnala nke ndị Dinka, ndị bi na Sudan ugbu a.[1]

Ngosịpụta dezie

Kejok bụ nwoke nwere ike ịrụ ọrụ ebube. A mụrụ ya nye nne Dinka, ọ bụ ezie na amụrụ ya site n'ime nke mmụọ nsọ. Kejok nwere nwanne nwoke aha ya bụ Menyang, ọ bụ ezie na a maghị ma ha nwere otu nna.[2]

Akụkọ ifo dezie

A na-ekwu na a mụrụ Kejok n'afọ 1700. Nne ya, Quay, tụụrụ ime Kejok na mberede mgbe ọ gara ọdọ mmiri na Korather, nso Shambe. A na-ejikọta ọdọ mmiri a na nna nna nke Dinka, Desheik. N'oge ahụ, Quay lụrụ Cheng, onye otu Akorbil nke Dinka.[3]

Quay mụrụ Kejok mgbe ọ dị ime ụbọchị ole na ole. Dịka ndị dike ọdịbendị ndị ọzọ, Kejok ghọrọ nwoke toro eto n'ime ọnwa ole na ole ma nwee ike ịrụ ọrụ ebube. O nwere ike ịgwọ ndị kpuru ìsì ma mepụta mmiri naanị site na iji nkwụ ya kụọ ala.[1]

Kejok nwere nwanne nwoke aha ya bụ Menyang. Ọ na-enwere ikike Kejok anyaụfụ ma bo ya ebubo amoosu. N'ikpeazụ, esemokwu malitere n'ihi ebubo Menyang. Kejok chọrọ idebe udo, ya mere ọ hapụrụ ndị Dinka. Okwu ikpeazụ ya bụ na ọ ga-alaghachikwuru nna ya, Chineke, ma ọ ga-alaghachikwute n'ihu ndị Dinka n'ọdịnihu.[2]

Hụkwa dezie

  • Ditaolane
  • Heitsi-eibib
  • Ndepụta nke akụkọ ifo Afrịka

Edemsibịa dezie

  1. 1.0 1.1 Lynch (2010). African Mythology, A to Z (in en). Infobase Publishing. ISBN 978-1-4381-3133-7.  Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":0" defined multiple times with different content
  2. 2.0 2.1 Kejok, Born Mysteriously, Restores Life (en). Oxford Reference. Retrieved on 2021-05-13. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":1" defined multiple times with different content
  3. FERGUSSON (1922). "PROVINCE NOTES". Sudan Notes and Records 5 (3): 163–170. ISSN 0375-2984.