Karabo Khakhau
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
ọrụ ọ na-arụ | Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị |
Karabo Lerato Khakhau bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị South Africa na-eje ozi dị ka onye otu Free State Provincial Legislature maka Democratic Alliance kemgbe Mee, na afọ 2019. Mgbe ọ dị afọ iri abụọ na otu n'oge a họpụtara ya, ọ ghọrọ onye kachasị nta n'ime ndị omeiwu mpaghara. Khakhau bụbu onye isi oche nke kansụl nnọchiteanya ụmụ akwụkwọ nke Mahadum Cape Town.
Mbido ndụ na agụmakwụkwọ
dezieKhakhau si Welkom na Free State. Ọ gụrụ akwụkwọ na Welkom-Gimnasium.[1] O nwere nzere bachelọ na sayensị mmekọrịta mmadụ na ibe ya na Mahadum obodo Cape Town .[2]
Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị
dezieKhakhau sonyeere Democratic Alliance na afy 2016.[1] N'ọnwa Ọktoba, na afo 2017, òtù ụmụ akwụkwọ DA meriri ihe ka ọtụtụ n'ime oche itoolu n'ime iri na ise na kansụl nnọchiteanya ụmụ akwụkwọ nke Mahadum Cape Town. A họpụtara ya ka ọ bụrụ onye isi oche nke SRC n'oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị.[3]
Mgbe ntuli aka mpaghara nke e mere na 8 Mee na afọ 2019, a họpụtara Khakhau na Free State Provincial Legislature ka nkwado pati ahụ na mpaghara ahụ na-eto.[4] A ṅụrụ ya iyi dị ka onye otu ndị omeiwu na 22 Mee, na afọ 2019. N'ihi ya, ọ ghọrọ onye kachasị nta, ebe ọ bụ na ọ dị nanị afọ iri abụọ na otu mgbe ọ malitere ọrụ.[5]
Ebenside
dezie- ↑ 1.0 1.1 Madisa. "Equality drives Karabo Khakhau", SowetanLIVE, 15 June 2019. Retrieved on 11 September 2020.
- ↑ Maputla. "#BlackGirlMagic: These female parliamentarians are only in their 20s", SowetanLIVE, 23 May 2019. Retrieved on 11 September 2020.
- ↑ Van Damme. DASO UCT wins SRC election. Democratic Alliance. Retrieved on 11 September 2020.
- ↑ Ngatane. "Meet the Free State’s youngest MPL, Karabo Khakhau", 21 May 2019. Retrieved on 11 September 2020.
- ↑ "Youngest member of legislature sworn in", Bloemfontein Courant. Retrieved on 11 September 2020.
Njikọ mpụga
dezie- Karabo Lerato Khakhau at People's Assembly