Kande Balarabe

Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Naijiria
kande Balarabe
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereKande Dezie
aha ezinụlọ yaBalarabe Dezie
Ebe ọmụmụSierra Leone Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụactivist, Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jiHouse of Representatives of Nigeria Dezie

Sa'adatu Kande Balarabe bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị Naijiria si Kano steeti . Ọ so na ụmụ nwanyị atọ a họpụtara ịbanye n'ụlọ omebe iwu Naijiria na 1983. Ọ jerela ọrụ n'ọkwa dị iche iche na steeti ya gụnyere onye isi ụlọ ọrụ na-ahụ maka ụmụ nwanyị Kano steeti. [1]

Ndụ dezie

A mụrụ Balarabe na Sierra Leone ebe nna ya na-azụ ahịa. Ọ gara ụlọ akwụkwọ ụmụ nwanyị Freetown na Royal School for Nursing na London. N'afọ 1982, n'oge mba nke abụọ, Kande ghọrọ onye isi n'òtù ụmụ nwanyị PRP na Kano. Tupu ọ banye na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọ bụ onye nọọsụ n'ụlọọgwụ steeti, [2] akpọrọ ụlọ ọgwụ Murtala Mohammed dị na Kano. Otú ọ dị, n'afọ 1982, ọ gbara arụkwaghịm iji tinye oge ka ukwuu na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. [3] N'afọ 1983, ọ zọọrọ ọchịchị wee nweta oche n'ụlọ omebe iwu Naijiria, agbanyeghị, e gbuturu mba nke abụọ. N'afọ 1987, ọ ghọrọ onye otu Constituent Assembly, na-anọchite anya mpaghara na steeti ya ma mesịa bụrụ onye isi oche nke Women Commission of Kano State.

Ihe ndetu dezie

  1. Musa (August 7, 2003). Kano frontline female politician dies. Archived from the original on 30 March 2013. Retrieved on 15 March 2016.
  2. Nelson, B. J., & Chowdhury, N. (1994). Women and politics worldwide. New Haven: Yale Univ. Press. P. 516
  3. Women Politicians on the Move. usaid.gov. CEDPA Nigeria Country Office. Retrieved on February 1, 2017.