Kalanoro bụ cryptid humanoid, ndị e kwenyere na ha na-ebi ndụ dị ka mmụọ n'àgwàetiti nke Madagascar. Omenala na-ekwu na ha na-ebibu n'ụdị anụ ahụ n'ime ọhịa mmiri ozuzo mana mbibi ebe obibi ha na-eme ka ọdịdị anụ ahụ ha kwụsị.[1]

A na-akọwa Kalanoro dị ka obere ihe yiri mmadụ nwere ntutu ya na ezé dị nkọ.[1] A na-ekwu na ụkwụ ha na aga azụ, nakwa ụkwụ chere ihu na azụ. Ma anya ha na-acha ọbara ọbara.[1][2] Ntutu isi ha na mbọ áká ha dị ogologo adịghị ọcha. Na-ebi ndụ naanị ha, a na-akọ na ha na'eri anụ esighi esi, ma nwee "olu na-awu akpata oyi n'ahụ" nke na-atụ nkịta egwu [3]

Akụkọ banyere kalanoro dịgasị iche. Enwere ike ise ha dị ka mmụọ ọjọọ ga-ezu ụmụaka, gbuo ndị mmadụ, ma ọ bụ zuo ha ohi.[2] N'oge na-adịbeghị anya, Kalanoro na ịṅụbigazi mmanya ókè . Otù ọ dị, a na-ahụkwa ha dị ka ndị ohu na-eguzosi ike n'íhé nye ndị enyi ha bụ mmadụ ma nwekwa ike nwé mmasị n'ebe ụmụ mmadụ nọ. Akụkọ Sakalava nwere ndị kalanoro na-atọrọ ụmụaka, mana ọ bụ naanị n'ihi mmeso omume ọjọọ nke ndị mụrụ ha. Ozugbo e mezuru ihe ndị kalanoro chọrọ, a kpọghachiri ụmụaka ahụ azụ.

Cryptids bụ isiokwu nke otu ihe omume nke Destination Truth.

Kalanoro n'Okpukpere Chi na Omume Ọhụrụ

dezie

A na-ekwu na Kalanoro na'arụ ọrụ dị ka mmụọ na-ejere ndị dị ndụ ozi.[1] A na-akọ na ha n'ezu ohi ma na-eme ka ihe nwéré ike karịrị nke mmadụ nyé ndị enyi ha bụ mmadụ, ndị nwekwara ike ịdọrọ ha maka ọgwụgwọ.[3] Ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ịzụta ọrụ nke kalanoro, ha na-eleta ụlọ ọrụ "onye nwe ụlọ" n'ụzọ omenala n'abalị, ma naanị n'eso ha na-emekọrịta ihe site na mgbidi ma ọ bụ n'ọnụ ụzọ mechiri emechi.[1] A na-ekwu na mgbe olu okwu mmadụ ghọrọ ụda imi ma dị elu, kalanoro si n'ime ha ekwu okwu.[1] A na-ekwukwa na Kalanoro n'enye ndị mmadụ iwu mgbochi site na nrọ ha ma ọ bụ site n'ọhụụ ha.[2]

A tụkwaala aro na ndị Vazimba bụ mmụọ nke kalanoro.[4]

Edemsibia

dezie
  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 1.5 Sodikoff (2012). Forest and Labor in Madagascar: From Colonial Concession to Global Biosphere (in English). Indiana University Press, 43. ISBN 9780253003096. 
  2. 2.0 2.1 2.2 Holmes (April 2018). "Fantastic beasts and why to conserve them: animals, magic and biodiversity conservation" (in English). Oryx 52 (2): 231–239. DOI:10.1017/S003060531700059X. 
  3. 3.0 3.1 Sharp (2001). "Wayward Pastoral Ghosts and Regional Xenophobia in a Northern Madagascar Town" (in English). Africa 71 (1): 38–81. DOI:10.2307/1161481. 1161481. 
  4. Graeber (1997). "Painful Memories" (in English). Journal of Religion in Africa 27 (4): 383. DOI:10.2307/1581909. 

Hụkwa

dezie