Josephine Chukwunonye

Josephine Chukwunonye
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
obodo maka egwuregwuNaijiria Dezie
Aha enyereJosephine Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya19 Maachị 1992 Dezie
Ebe ọmụmụAnambara Steeti Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye otu egwuregwu bọọlụ Dezie
ọnọdụ egwu na otu / ọpụrụicheonye na-agbachitere Dezie
onye nsonye òtù egwuregwuRivers Angels F.C., Washington Spirit, Nigeria women's national under-20 football team, Ndị otu egwuregwu bọọlụ ụmụ nwanyị nke mba Naịjirịa, Vittsjö GIK Dezie
ụdị egwuregwuFootbọl Dezie

Àtụ:Infobox football biography

Josephine Chiwendu Chukwunonye (amụrụ 19 Maachị 1992) bụ onye egwuregwu bọọlụ Naịjirịa na-agba Kungsbacka na Damallsvenskan na maka otu egwuregwu bọọlụ ụmụ nwanyị Naịjirịa . Ọ gbaburu bọọlụ na mpaghara Rivers Angels afọ asaa na Washington Spirit na Otu Egwuriegwu boolu Nke Umunwaanyi.

Ọrụ klọb dezie

Ka ọ gbachara afọ asaa na Rivers Angels n'asọmpị ụmụnwaanyị Naịjirịa, n'ọnwa Jun afọ 2015 ka a mara ọkwa na Chukwunonye ga-esonye na otu Egwuriegwu boolu Nke Umunwaanyi Washington Spirit . A bịanyere aka na ya n'otu oge ahụ Hayley Raso mba Australia, na ọkwa ahụ na-abịa ụbọchị tupu otu egwuregwu bọọlụ ụmụ nwanyị Naịjirịa gbagoro Australia na asọmpi iko mba ụwa nke FIFA 2015 . Chukwunonye kwuru n'oge ahụ, "Obi dị m ụtọ isonye na ezinụlọ Washington Spirit; ọ bụ ihe ọṅụ na nrọ mezuru m, ọ na-amasị m iso nnukwu ndị egwuregwu dịka Crystal Dunn, bụ onye m zutere n'asọmpi U20 World Cup na 2012. . Obi dị m ụtọ iso onye nchịkwa Parsons rụkọọ ọrụ n'ihi na amaara m na ọ ga-ewepụta ihe kacha mma n'ime m." Chukwunonye bụ onye mba Naịjirịa nke abụọ na squad, sonyere Francisca Ordega . [1] [2] Mgbe ọ gbasịrị egwuregwu abụọ maka otu ahụ, a tọhapụrụ ya na Disemba 2015. [3]

Na March 2016, ma Chukwynonye na onye mba Naijiria ibe ya bụ Ngozi Okobi bụ ndị otu Sweden Vittsjö GIK bịanyere aka na ya. Ha na-agbakọbu ọnụ na squad nke Washington Spirit, na mgbe ha na-akwaga Vittsjö GIK, ha na ndị mba Naijiria abụọ ọzọ sonyeere, Nkem Ezurike na Ifeoma Dieke . Chukwynonye kwuru "Obi dị m ụtọ ịbanye na ezinụlọ Vittsjo; ọ bụ ihe ọṅụ na nrọ mezuru m, ọ na-agụsi m agụụ ike igosi onwe m ma nyekwa ike m niile iji kwalite klọb ahụ n'ebube". [4]

Ọrụ mba ụwa dezie

Chukwunonye nọchitere anya Naijiria n'ọkwa ndị obere na asọmpi iko mba ụwa nke FIFA U-17 na 2012 FIFA U-20. N'ọkwa dị elu ọ so na ndị otu Naijiria na asọmpi iko mba ụwa nke FIFA nke 2011 na 2015 yana asọmpi ụmụ nwanyị Africa na mbipụta 2010, 2012 na 2014, merie asọmpi ahụ ugboro abụọ ( 2010 na 2014 ). [5]

Nkwanye ugwu dezie

Mba ụwa dezie

Naijiria
  • Asọmpi ụmụnwaanyị Afrịka (2): 2010, 2014

Klọb dezie

Rivers Angel
  • Asọmpi umunwanyi Naijiria (1): 2010
  • Iko ụmụ nwanyị Naijiria (5): 2010, 2011, 2012, 2013, 2014

Edensibia dezie

  1. Nigerian defender Josephine Chukwunonye set to join Spirit after the Women's World Cup. Washington Spirit. Retrieved on 30 June 2015.
  2. Player profile. Washington Spirit. Archived from the original on 5 October 2017. Retrieved on 30 June 2015.
  3. Spirit Waive DefenderJosephine Chukwynonye. NWSL (22 December 2015). Archived from the original on 12 November 2016. Retrieved on 11 November 2016.
  4. "Vittsjö switch excite Super Falcons duo Josephine Chukwunonye & Ngozi Okobi", Yahoo! News, 24 March 2016. Retrieved on 11 November 2016.
  5. FIFA player stats. FIFA. Retrieved on 29 June 2015.

Njikọ mpụga dezie

  • Josephine Chukwunonye – FIFA competition record (archived)
  • Josephine Chukwunonye na Soccerway

Àtụ:Navboxes colour