Joint National Association of Persons with Disabilities

 

The Joint National Association of Persons with Disabilities (JONAPWD) bụ otú nke ndị nwere nkwarụ nke e ehibere na afọ otu puku, narị itoolu na iri itoolu na na abụọ nke na-achịkọta ụlọ ọrụ niile nwere nkwarụ na obodo Naịjirịa. Isi ụlọ ọrụ nke ndị otu a dị na Abuja na onye isi nchịkọta ndị otu a bụ Abdullahi Aliyu Usman . [1] [2] Banyere otu a na mba ụwa, nzukọ a bụ onye otu Commonwealth Disabled People's Forum na African Disability Forum. [1]

Ihe omume ndị [3] isi ha na-eme na-agba gburugburu ịkwalite mmata banyere dị nma nke ndị nwere nkwarụ na mba ahụ dum, ịkwalite ikike ha site na ịmepụta iwu na ụkpụrụ dịka mkpa ha si dị, iji jikọta ha na ndụ ọha na eze nke mba ahụ ma ha na-akwadokwa nyochaacha banyere ihe ịma aka na nsogbu dị iche iche ha na-eche ihu na ndụ kwa ụbọchị, ihe niile dị n'elu na ebumnuche nke imeziwanye ndụ nke ndị nwere nsogbu.

Nkwado dezie

Otu n'ime ọrụ ndị ha rụrụ n'ókèala Naijiria bụ iji dozie ihe ịma aka ụfọdụ ndị nwere nkwarụ ọ bụla na-eche ihu. [4] ọmụmaatụ, ha esonyerela ndị njem gaa n'ọdụ ụgbọ elu Naijiria, dị ka Nnamdi Azikiwe International Airport, ebe ha mere ka ọha mara mkpa ndị nwere nkwarụ na nsogbu ịnụ ihe chọrọ ịbanye n'ụgbọelu.

[5]'ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị isi nke nzukọ ahụ arịọwo n'ihu ọha site na mgbasa ozi ka a mee ka ntaramahụhụ sie ike nakwa ka e nwee oge mkpọrọ dị irè maka ndị a mara ikpe maka ịdọrọ ego ọha na eze maka ndị nwere nkwarụ.

Ihe odide dezie

  1. Biriowo. "Campaigners urge Nigerian govt to finalise disability treaty", Tribuneonlineng.com, 24 October 2023. Retrieved on 16 November 2023.
  2. Commonwealth Disabled People's Forum. Members. Retrieved on 16 November 2023.
  3. Onalu (October 2023). "An Exploratory Study of the Situation of Persons with Disabilities in Nigeria: Practice Consideration for Social Workers". Journal of Evidence-Based Social Work. Retrieved on 16 November 2023. 
  4. "Despite inclusive law, Nigerian airports still a nightmare for people with disabilities", Thecable.ng, 14 October 2023. Retrieved on 16 November 2023.
  5. Abolade. "Jail corrupt govt officials stealing from the disabled, PWD urges Buhari". Retrieved on 16 November 2023.

Njikọ mpụga dezie