John Arthur Liebenberg (n'ubochí atọ n'ọnwa Machị n'afọ 1958 rụọ úbọchị irí nà isii n'ọnwa Febụwarị afọ 2020) bụ onye nta akụkọ foto South Africa, nke a maara maka ihe banyere idepụta ọgụ nnwere onwe Namibia. Ọ bụ otu n'ime ndị ọrụ guzobere na onye na-ese foto na The Namibian .[1]

Mbido ndụ na ọrụ dezie

A mụrụ Liebenberg n'afọ 1958 na Johannesburg, South Africa, ma kemgbe ọ dị afọ abụọ ọ nọrọ oge n'ụlọ ụmụ mgbei na Johannesburg. Nna ya etinyela ya na nwanne ya nwanyị n'ụlọ ụmụ mgbei maka ihe dị iche iche. Ógè ọ dị afọ iri na asatọ, e debara aha ya n'akwụkwọ ka ọ bụrụ onye agha ma zigara ya Namibia n'afọ 1976. Liebenberg lụrụ Ute n'afọ 1984, onye na-eme violin. Mgbe ọ mụsịrị ụmụ atọ, ya na Ute gbara alụkwaghịm. Ọ lụrụ Inge Kühne n'afọ 2005, mana ha gbara alụkwaghịm.[2]

Liebenberg bụ onye na-ese foto akụkọ nke egosila ọrụ ya n'Africa na Europe.[3] O dere akwụkwọ màkà Agha Mpaghara South Africa (nke a na-akpọkarị Agha nke Nnwere Onwe nke Namibia) nke bu ụzọ nweta nnwere onwe Namibia n'afọ 1990, Liebenberg rụkwara ọrụ dị ka onye na-ese foto na Agha Obodo Angola, ma mesịa rụọ ọrụ dị ka magazin na onye na-se foto n'efu na South Africa.[4] N'afọ 2010, ya na Patricia Hayes dere akwụkwọ: Bush Of Ghosts: Life And War In Namibia nkè afọ 1986 rụọ 1990.

Ọnwụ dezie

A nabatara ya n'ụlọ ọgwụ dị na Johannesburg mgbe ọ gbajiri ụkwụ ya n'ịda n'ubochí irí n'ọnwa Febụwarị n'afọ 2020.[5] Ọ nwụrụ n'ubochí irí na isii n'ọnwa Febụwarị 2020 mgbe ọ dị afọ iri isii na otu na Johannesburg, South Africa, na-esote nsogbu na mgbake ya site na ịwa ahụ.[6] Nwanne ya nwanyị, Isabel, nwunye abụọ: Ute Liebenberg na Inge Kühne, na ụmụ anọ hapụrụ ya.

Edensibia dezie

  1. Photographer John Liebenberg has died (en). NBC. Archived from the original on 2020-02-17. Retrieved on 2020-02-17.
  2. Namibian. A Man Who Photographed War And Suffering (en). The Namibian. Archived from the original on 2022-06-15. Retrieved on 2020-02-21.
  3. John Liebenberg (en-US). www.afronova.com. Archived from the original on 2019-11-02. Retrieved on 2020-02-17.
  4. Error on call to Template:cite web: Parameters url and title must be specified.
  5. Namibian. Liberation war photographer John Liebenberg dies (en). The Namibian. Retrieved on 2020-02-17.
  6. Namibian. Photographer John Liebenberg remembered for iconic images (en). The Namibian. Retrieved on 2020-02-17.