John Lee Clark (amụrụ n'afọ 1978) bụ onye America na-ede uri, onye edemede, na onye na-eme ngagharị iwe si Minnesota. Ọ bụ onye dere Suddenly Slow (2008) na Where I Stand: On the Signing Community and My DeafBlind Experience (2014), na onye nchịkọta akụkọ nke anthologies Deaf American Poetry (2009) na Deaf Lit Extravaganza (2013).[1][2] Clark bụ onye natara onyinye National Magazine Award nke afọ 2020. Ọ bụ onye a ma ama na-eme ngagharị iwe na Protactile movement.

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ

dezie

A muru Clark n'ezinulo nti chiri na ndi signing, o mechara kpuo isi. Asusu ona asu bu American sign language, omutaghi etu esi agu Ihe n'asusu bekee ruo mgbe odi afo iri na abuo .[3] Ọ malitere ikpu ìsì mgbe ọ dị afọ iri na ụma. Ọ bụ onye ntị chiri nke ọgbọ nke abụọ.[4]

Clark gụsịrị akwụkwọ na Minnesota State Academy for the Deaf wee gaa Mahadum Gallaudet . [5][6]

Ọrụ

dezie

Clark bụ onye nkuzi Braille na ProTactile na Minnesota . [7]

Nkwado na onyinye

dezie

Clark enwetala onyinye na mkpakọrịta site na Minnesota State Arts Board, VSA Minnesota, Laurent Clerc Cultural Fund, Intermedia Arts Center, na The Loft Literary Center. Ọ bụ onye edemede a ma ama na Deaf Way II International Cultural Arts Festival, ọ bụkwa onye ikpeazụ maka 2016 Split This Rock Freedom Plow Award for Poetry and Activism.[2] Edemede Clark "Tactile Art" pụtara na magazin Poetry n'ọnwa Ọktoba 2019 wee merie 2020 National Magazine Award for Essays and Criticism.[8][9]

Ndụ onwe onye

dezie

Clark nwere Ọrịa Usher.[5] Ọ lụrụ onye na-ese ihe Adrean Clark ma ha nwere ụmụ nwoke atọ.[7]

  1. Grossmann. "Hopkins DeafBlind poet, essayist receives $50,000 grant", St. Paul Pioneer Press, October 25, 2020.
  2. 2.0 2.1 John Lee Clark (en). Poetry Foundation (2020-11-04). Retrieved on 2020-11-05. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":0" defined multiple times with different content
  3. (July 2010) "Interview with John Lee Clark". Wordgathering: A Journal of Disability Poetry 4 (2). ISSN 2690-7089. Retrieved on 2020-11-05. 
  4. Split This Rock: Interview with John Lee Clark, a finalist for the 2015 Freedom Plow Award for Poetry & Activism. Split This Rock (March 18, 2015). Retrieved on 2020-11-05.
  5. 5.0 5.1 Pratt. "Hopkins poet speaks to his identity as a DeafBlind man", Star Tribune, February 3, 2015. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "Star Tribune" defined multiple times with different content
  6. Reis (October 2015). Reis on Clark, 'Where I Stand: On the Signing Community and My DeafBlind Experience'. H-Disability. H-Net Reviews. Retrieved on 2020-11-05.
  7. 7.0 7.1 About John Lee Clark. poets.org. Academy of American Poets. Retrieved on 2020-11-05. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":2" defined multiple times with different content
  8. Yeh. "'New kinds of contact': A DeafBlind poet's push for a radical language of touch", Inverse, December 1, 2020. (in en)
  9. "Poetry magazine wins National Magazine Award in the Category of Essays and Criticism", Poetry Foundation, May 29, 2020. (in en)