Jibrin Ndajiwo
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereJibrin Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya29 Maachị 1948 Dezie
Ebe ọmụmụLavun Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya11 Ọgọọst 2020 Dezie
Ebe ọ nwụrụDoko Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye òká ikpe Dezie
Ọkwá o jichief judge Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum Ahmadu Bello Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)1991 Dezie

Jibrin Ndatsu Ndajiwo (A mụrụ n'abalị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Maachị afọ 1948 – ọ nwụọ n'abalị iri n'otu nke ọnwa Ọgọst nke afọ 2020) bụ onye nkuzi na ọka iwu nke rụrụ ọrụ dịka Onye ọka ikpe nke Niger steeti site n'afọ 1991 ruo ezumike nka n'afọ 2013, ọ nwekwara aha otutu ọdịnala Magajin Garin Nupe ruo mgbe ọ nwụrụ. [1] [2] Fati Lami Abubakar nọchiri ya dịka onye nnọchiteanya ọka ikpe. [3] [4]

Ndabere dezie

A mụrụ Ndajiwo n'obodo Doko nke Lavun, Niger Steeti . Ọ malitere mbido agụmakwụkwọ n'ụlọ akwụkwọ praịmarị Doko nke obodo ya site n'afọ 1956 ruo afọ 1959 wee kwaga Bida n'afọ 1960 ịga Ụlọakwụkwọ Praịmarị Agadi Nke Ndayako ruo afọ 1962. Ọ gara ụlọ akwụkwọ sekọndrị site n'afọ 1963 ruo afọ 1969 na kọleji Gọọmenti Bida n'afọ 1970 ruo afọ 1973 ọ gụchara akwụkwọ na mahadum Ahmadu Bello . Ọ gara ụlọ akwụkwọ Iwu Naịjirịa site na 1973 ruo 1974 wee gaa mahadum QMC, London site na afọ 1979 ruo afọ 1980. Ọ gara mahadum Lagos maka agụmakwụkwọ nke Ụlọakwụkwọ iwu dị elu n'afọ 1981. [5]

Ọrụ dezie

Ọ malitere dịka onye nkuzi na kọleji ndị nkuzi ụmụ nwanyị, Minna n'afọ 1970 ruo afọ 1973 ebe a kpọgara ya na Ụlọikpe Mpaghara dị ka onye nyocha, onye ndụmọdụ steeti n'afọ 1974. Ọ mechara bụrụ onye nnọchiteanya onye ọkaikpe ukwu n'afọ 1977 wee bụrụ Onye ọka ikpe n'afọ 1979. [6] N'afọ 1980, a họpụtara ya dịka onye isi na -edeba aha nke Ụlọikpe dị Elu nke dị na Minna mgbe ahụ bụ afọ 1983 Ọ kwagara Mịnịstrị Ụlọikpe nke Niger Steeti dịka onye ọkaiwu izugbe na onye ode akwụkwọ n'adigide n'afọ 1985. Ọ bụ onye otu na Amiral Hajj n'oge ọchịchị abụọ. [7] Ọ mechara bụrụ onye isi ọkaikpe nke ụlọ ikpe ukwu nke Niger steeti nke a họpụtara ya n'ọnwa Disemba afọ 1991 ruo Maachị afọ 2013 ka O jere ozi afọ iri abụọ na abụọ. [8]

Ọ jekwara ozi dị ka onye isi oche Ụlọ ọrụ njem na njem ala nsọ nke Niger Steeti site n'afọ 2013 ruo ọnwụ. [9]

Ọkwa ọchịchị o jidere

Ndajiwo jidere ọkwa dị iche iche na steeti na gọọmentị etiti nke gụnyere: [10] [11]

  • Onye isi oche kọmiti ọrụ ikpe na steeti Niger steeti
  • Odeakwụkwọ nke Mịnịstrị ikpe ziri ezi (1977) na ndụmọdụ steeti (1977)
  • Onye isi ndeba aha nke Ụlọ ikpe dị elu Niger steeti (site n'afọ 1980 ruo afọ 1985)
  • Onye isi oche, Kọmitii steeti Niger maka njikwa agụmakwụkwọ (1984)
  • Onye isi oche, Kọmitii Niger Steeti na Ọrụ nke Bọọdụ Ndị Ọrụ Nlekọta Ndị njem ala nsọ (1984)
  • Onye isi oche nke ụlọ ikpe mkpegharị ntuliaka Niger Steeti
  • Onye otu, Bọọdụ ndị gọvanọ Kọleji Ọrụ ugbo Niger Steeti, Mokwa (1985)
  • Onye otu, Kọmitii Ala na oke ala Niger Steeti (1985)
  • Onye otu, Kọmitii Ike Ebere nke steeti Niger (1982-1985)
  • Onye otu, Ahụ nke ndị nchekwa
  • Onye otu, Nzukọ ndị ọkà ikpe mba na Naịjirịa
  • Onye isi oche, Kọmitii ikpe steeti Niger (1991)

Nkọwapụta dezie

  • Akara ukwu nke onye ọka ikpe: akwụkwọ nsọpụrụ nke ịbụ onye nwe ya Onye isi ọka ikpe nke steeti Niger Hon. Justice Jibrin Ndatsu Ndajiwo OFR ACI Arb . ed Dr. Shehu Abdullahi Zuru, osote onye isi ngalaba iwu, Mahadum Abuja . J N. Ndajiwo, S.A Zuru. Abuja, Naịjirịa , Chartered Graphic Press, 2013.  ,  .

Ndụ onwe dezie

Ọ lụrụ Aishetu Aliyu Lemu na 1974 wee mụọ ụmụ nwoke abụọ, ụmụ nwanyị abụọ.

Ebensidee dezie

 

  1. Magajin Garin Nupe, Justice Ndajiwo, Dies At 72 (en-GB). Leadership Newspaper (2020-08-12). Retrieved on 2020-09-29.
  2. Former Chief Judge of Niger State, Justice Jibrin Ndatsu Ndajiwo, Dies at 72 (en-US). Naijablaze (2020-08-12). Retrieved on 2020-09-29.
  3. Metro. "Justice Fati Abubakar heads Niger State judiciary", PM News, 28 March 2013. Retrieved on 29 September 2020.
  4. Niger appoints Abdulsalami Abubakar’s wife, Fati, as Acting Chief Judge | Premium Times Nigeria (en-GB) (2013-03-28). Retrieved on 2020-09-29.
  5. NewNigerianNewsPapers (2020-08-11). Niger Loses Former Chief Judge Ndajiwo At 72 (en-US). New Nigerian Newspaper. Archived from the original on 2021-01-14. Retrieved on 2020-09-29.
  6. "Niger state former chief judge dies at 72", Media Trust, 11 August 2020. Retrieved on 29 September 2020.
  7. Chioma (2020-08-11). Niger State’s Former CJ Dies At 72 (en-US). TheNigeriaLawyer. Retrieved on 2020-09-29.
  8. Dennis (2020-08-11). Death of former Chief Judge, Justice Ndajiwo, great lost to the country - Niger State Governor (en-US). Daily Post Nigeria. Retrieved on 2020-09-29.
  9. Hamagam (11 June 2013). Nigeria: Ndajiwo Appointed Niger Pilgrims' Agency Chair. Media Trust Abuja. Retrieved on 29 September 2020.
  10. Udo (2017-03-13). NDAJIWO, Justice Jibrin Ndatsu (en-US). Biographical Legacy and Research Foundation. Retrieved on 2020-09-29.
  11. adeolaomotayo (2020-08-11). NIGER STATE GOVERNOR ABUBAKAR SANI BELLO COMMISERATES WITH FAMILY OF LATE JUSTICE JIBRIN NDATSU NDAJIWO (en-US). Glimpse Nigeria. Archived from the original on 2021-01-15. Retrieved on 2020-09-29.

Njikọ mpụga dezie