Jaywon

onye na-ese egwu

Àtụ:Infobox musical artist Jaywon

Jaywon
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha n'asụsụ obodoOluwajuwonlo Iledare Dezie
Aha ọmụmụOluwajuwonlo Iledare Dezie
aha pseudonymJaywon, Oba Orin Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya6 Jụn 1986 Dezie
Ebe ọmụmụȮra Kogi Dezie
Ọrụ ọ na-arụodee egwu, onye na-abụ abụ, omee, performing artist Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2005 Dezie
agbụrụNdi Yoruba Dezie
Ụcha ime anyabrown Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
ụdịAfrican popular music Dezie
Ihe nriteNigeria Entertainment Awards, The Headies 2013 Dezie
nnọchiaha nkeonweL485 Dezie

Aha Iledare Oluwajuwonlon

Amaara ya dịka Oba Orin

Amụrụ 6 Juunu 1986 (afọ 34)

Egbe, Kogi Steeti, Naịjirịa

Nkenụụdị Afuropọpụ

Aka ọrụ Otii egwu, Odee egwu, Omee egwu

Afọ ọ nọ ọrụ 2005–ugbua

Lebeelụ Next World Music

Ndị egwu

Don Jazzy

Reminisce

D'Banj

Tonto Dikeh

Olamide

Dr SID

Davido

Iledare Oluwajuwonlo (amụrụ ya na abalị isii na Juunu 1986), nke amara aha ya dịka Jaywon, bu onye na-eti egwu na Naịjirịa, onye n’ede egwu, na eme ihe oyonyo, na emeputa ihe. Ọ malitere akara ndekọ egwu ya aha ya bụ Next World Music na 2013 mgbe ọpụsịrị na Kennis Music . [1] A kwanyere Jaywon ugwu site na onyinye nturu ugo ọkacha mma onye egwu na Naịjirịa Muziki Vidiyo Awọdụ na 2009. Ọ natakwara onyinye ọkacha mma na ndekọ egwu na Headies 2013 nakwa Tush Awọdụ maka egwu 'This Year'.

Ndụ na ọrụ dezie

Jaywon gụsịrị ụlọ akwụkwọ praịmarị ya na ECWA Praịmarị Sukulu wee gaa n'ihu iji mezuo ụlọ akwụkwọ sekọndịrị ya na "Government Sekọndịrị Sukulu na Kogi Steeti, tupu ọ gụsịa akwụkwọ HND na Akaụntụ na Federal Politeknik, Bida. 

Onye Otii egwu a kwagara Legọọsụ na 2005 ka otu n’afọ gachara, ọ nwetara nkwado ntikọta egwu nke ya na Ray G, Sound Sultan, W4, Slizzy E na 2face. 

Na 2009, Jaywon nwetara ohere ịmepụta egwu ya na "Kennis Muziki Ista Fiyesta, o mere nnukwu ọfụma nke mere ndị na-ahazi ihe omume ahụ nwere mmasị ozugbo na ya. Mgbe e mesịrị n'otu afọ ahụ, Jaywon bịanyere aka na ndekọ egwu na "Kennis Music Record Label"..[2] N’ọnwa Disemba afọ 2012, o wepụtara ‘Odun Yi (This Year)’ nke pụrụ iche na nke otuto na 2013. O mechara bịanye aka na PZ Cusson  nke mere ka ụlọ ọrụ ahụ jiri egwu ya, 'This Year' maka ịkwado ahịa ha.

Next World Music na abọm 'Oba Orin' dezie

Mgbe ọ gachara indie, ọ wepụtara abọm ya a na-atụ anya ya na nke atọ akpọrọ 'Oba Orin' mgbe anọ gachara nke gosipụtara Vector, Reminisce na Reekado Banks . Nke a bụ ihe na-esote abọm abụọ ahụ ọ wepụtara na Kennis Music .

360nobs dere akwụkwọ egwu ahụ: 'Oba Orin bụ ezigbo nchịkọta ụda nke gosipụtara talentị Jaywon kachasị mma na egwu pọpụ ya. Ọ dị ọgaranya, dị ndụ, na-enye ume ọhụrụ mgbe niile. Jaywon nwere ike ikwuwa ọnụ mana onweghị onye ga-asị na ọ naghị arụ ọrụ maka ya oge ọbụla. Naanị oge ga-egosi ma ọ nwetala aha ahụ. [2]

PulseNG na-atụle ya 3/5 wee dee: 'Na njedebe nke abọm ahụ, ị ga-enwe mmetụta na Jaywon awụpụọla mkpụrụ obi ya, na-ejikọ mmetụta ya na inwe oke okike nka ya na gị. Ọ dị ka Jaywon a na-eme egwu maka gị, n'ebe ọgbakọ mmadụ juru. ' [3]

'Oba Orin' nke pụtara 'King of Songs' n'asụsụ Yoruba bụ ọba egwu nwere egwu 21 nke mmepụta ya sitere n'aka Mr Ejor, Benjaminossy, Blaq Jerzey na Young Jonn. Jaywon nyere ego izizi izu abụọ nke abọm 'Oba Orin' ya na Ụmụ Mgbei. [4] Onye egwu a gara 2016 ACIA Awọdụ na Atlanta, United Steeti ma nweta ihe nrite "Best Indigenous Act". [5]

2014 – ugbu a: Egwu ya ndị edere n'okpuru Next World Music dezie

Jaywon bidoro remix maka "Madantin" na 2014 nke gosipụtara Phyno, Olamide na May D n'okpuru akara Next World Music nke soro 'Tanawole' gosipụtara Reminisce [6] izu ole na ole gachara. Ọ rụkọrọ ọrụ ys na rapa Vector tha Viper na Back to Sender[7]

Ihe nkiri dezie

Aha Afọ Ụbọchị mwepụta
"Mandantin Rimisi" "



</br> (gosipụtara Phyno, Olamide na May D)
2014 21 Febuwarị 2014
"Tanawole"



</br> (na Reminisce )
1 Mee 2014
"Kule Lori"



</br>
27 Mee 2014
"Back to Sender"



</br> (yana Vector the Viper])
8 Ọgọstụ 2014
"Me& You"



</br> (na YQ)
20 Septemba 2014
"Fire for Fire" 31 Ọktoba 2014
"Okun United" 2015 13 Febuwarị 2015
"Gbawo" 9 Julaị 2015
"Another Xmas" 21 Disemba 2015
"Jolly Muke" 29 Machị 2016
"Champion" 2016 22 Epurel 2016
"Paraga" 18 Mee 2016
"Gbadun" 2016 14 Julaị 2016
"Another Level" ft Mr Eazi 6 Nọvemba 2016
"Another Christmas is here" 7 Disemba 2016
"Aje (rimisi part 1)" ft. (Barry jhay, lyta) " 2019 Juunu 05 2019

Onyinye na nhọpụta dezie

  • NEA Awards / Ọkacha Onye Egwu Ọhụrụ (2009) - Meriri
  • Headies Awards / ndekọ nke Afọ (2013) - Meriri
  • ACIA / amaala egwu kacha mma (2016) - Meriri
  • Tush Awards / Mmata Pụrụ Iche (2016)

Nsidee dezie

  1. Jaywon speaks on Kennis Music deal. NET. Retrieved on 8 April 2014.
  2. 2.0 2.1 Album Review: Jaywon Is King on Oba Orin. 360nobs (26 July 2016). Archived from the original on 27 July 2016. Retrieved on 26 July 2016.
  3. Pulse Album Review: Jaywon's "Oba Orin' is immersive, live, and traditional. PulsNG (25 April 2016). Retrieved on 24 April 2016.
  4. Jaywon gives all first two week return to Orphanage.
  5. Jaywon wins Best Indigenous Act at ACIA Awards. Archived from the original on 2017-05-10. Retrieved on 2020-11-27.
  6. Jaywon = Tana Wole (Remix) ft. Reminisce. Tooxclusive (21 February 2014). Retrieved on 14 April 2015.
  7. Jaywon - Back to Sender ft. Vector. Bellanaija (21 February 2022). Retrieved on 14 April 2022.