Jalingo

Obodo na Naijiria

Jalingo bụ isi obodo nke Taraba Steeti dị n'ebe ugwu ọwụwa anyanwụ Naịjirịa, aha ya bụ Fulfulde okwu Jalingo pụtara "ebe dị elu" ma mee atụmatụ na ọnụ ọgụgụ mmadụ dị Puku narị anọ na iri na asatọ, 418,000 ka ọ na-erule afọ 2018, obodo ahụ enwetala ọnụ ọgụgụ kachasị elu nke ndị si Kano, Borno, Gombe na Cameroon dị nso. Ka ọ na-erule n'ọnwa Nọvemba afọ 2022, a na-eme atụmatụ na obodo ahụ nwere ihe dị ka mmadụ puku narị ise na iri asatọ na otu .

Jalingo

Agbụrụ dị iche iche

dezie

Obodo a jupụtara na pacenti iri isii ma bụrụ nke ndị Fulani bi n'oge Fulani Jihad nke Usman Dan Fodio na-achị. Mumuye, Kuteb na Kona bụ ndị ka nta pacenti iri abụo nà ise, pacenti iri na ise nakwa pacenti iri n'otu n'otu. A na-ahụ Wurkum, Hausa, Jukun, Jonjo n'ọnụ ọgụgụ dị ukwuu.[1]

A na-asụ Fulfulde, Mumuye, Hausa, na ọtụtụ asụsụ ndị ọzọ na Jalingo.[2] Ebe alaeze Muri na Obí Eze nke Jalingo, obodo e guzobere n'oge Mozịlim Jihad.

Onye isi oche na-elekọta

dezie

Gọọmentị ime obodo ọ bụla na Naịjirịa na-achịkwa ndị isi oche na-elekọta ya. Ha bụ ndị na-ahụ maka ihe omume nke steeti.

Onye a họpụtara dịka onye isi oche nke Jalingo n'oge ntuli aka ikpeazụ n'afọ 2020 [3] bụ Hon. Abdulnaseer Bobboji nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị People Democratic Party (PDP). [4] Ọ bụ onye isi oche nlekọta ruo mgbe ọ gwụchara na Sọnde, abalị atọ nke ọnwa Julaị afọ 2022.[5][6] Mgbe nke ahụ gasịrị, Gọvanọ Taraba Steeti, Arch. Darius Dickson Ishaku họpụtara onye bụbu odeakwụkwọ nke ụlọ ọrụ na-ahụ maka ahụike nke Ụlọ ọrụ mmepe nlekọta mbụ

Taraba, Alh. Aminu Jauro dị ka onye isi oche nke Jalingo.

[7][5]

Ahịa

dezie

Jalingo dị ka isi obodo nke Taraba Steeti nwere ọtụtụ ahịa, mana ahịa ndị a ma ama bụ:

  • Oke Ahịa Jalingo [8]
  • Kasuwan Yelwa Ahịa Yelwa [9]

Ọnọdụ ihu igwe

dezie

Oge mmiri ozuzo na Jalingo bụ nke na-emegbu mmadụ ma na-ekpo ọkụ, Oge ọkọchị bụ nke na na-ekwo ọkụ n'afọ niile. Nkezi okpomọkụ kwa afọ sitere na iri isii na otu ruo iri iteghete na iteghete degrees Fahrenheit, na ala na elu nke iri ise nà isii na narị na ise degrees. [10] [11][12] Site na mmụba na-emekarị na mmiri ozuzo n'elu ugwu na n'akụkụ ifufe na onyinyo mmiri ozuzo na n'elu ala, ihu igwe Jalingo na-egosipụta usoro ihu igwe nke mpaghara ihu igwe ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ nke mmetụta nke ugwu ụfọdụ gbanwere.

Na nkezi okpomọkụ dị elu kwa ụbọchị nke iri iteghete nà isii°F, oge okpomọkụ na-ewe ọnwa abụọ mara atọ, site na abalị anọ nke ọnwa Febụwarị ruo abali iri na ise nke ọnwa Eprel .  Na nkezi elu nke dị iri iteghete nà iteghete°F na ala nke iri asaa nà anọ°F, Machị bụ ọnwa kachasị ọkụ n'afọ na Jalingo. [10][13]  

Na nkezi okpomọkụ dị elu kwa ụbọchị n'okpuru iri asatọ nà isii°F, oge oyi na-ewe ọnwa atọ na ụma anọ, site na abalị iri abụo na ise nke ọnwa Juunu ruo na abalị isii nke ọnwa October .  Na Jalingo, Disemba bụ ọnwa kachasị jụụ n'afọ, na nkezi ala nke iri isii nà atọ°F na elu nke dị iri iteghete na otu °F.[10][13]  

Mkpuchi Igwe ojii

dezie

Nkezi nke igwe ojii kpuchiri na Jalingo dịgasị iche iche site n'oge ruo n'oge n'afọ.[10]

N'ihe dị ka Ụbọchị iri atọ nke ọnwa Ọktọba na-egosi mmalite nke oge doro anya nke Jalingo, nke na-ewe ọnwa anọ mara abụọ ma na-agwụ na abalị isii nke ọnwa Machị . [10]

Na Jalingo, Jenụwarị bụ ọnwa kachasị ọcha n'afọ, na mbara igwe na-anọgide na-enwu gbaa, na-enwekarị ìhè, ma ọ bụ na-enwekwa ihu igwe pacenti iri ise nà otu nke oge na nkezi.[10]

Malite n'ihe dị ka Ụbọchị isii nke ọnwa Machị ma na-adịgide ruo ọnwa asaá mara uma asatọ oge igwe ojii nke afọ na-agwụ n'ihe dịka abalị iri atọ nke ọnwa Ọktoba. [10]

Ọnwa Mee bụ ọnwa igwe ojii kachasị n'afọ na Jalingo, na igwe na-ekpuchi ma ọ bụ na-ekpuchaghị pacenti iri asatọ na asaa nke oge na nkezi.[10]

Mmetụta nke mgbanwe ihu igwe na Jalingo

dezie

Afrịka, ọkachasị Naịjirịa, nwere mmetụta nke mgbanwe ihu igwe n'ihi njirimara ala ya, gụnyere ókèala ya kpọrọ nkụ n'ebe ugwu na mpaghara ndịda dị n'ụsọ oké osimiri. Nnukwu ịdabere na mpaghara ahụ na ọrụ ugbo mmiri ozuzo, tinyere ịda ogbenye na ikike mmeghachi omume dị nta, na-eme ka ọ dịkwuo mfe. Ọnọdụ a, tinyere usoro mgbanwe na-ezughị ezu na nsogbu ego n'etiti ndị mmadụ n'otu n'otu, na-ebute nnukwu egwu ma na ọdịmma ọha na eze na akụ na ụba nke ndị Afrịka. Nsonaazụ ọjọọ sitere na mgbanwe ihu igwe, dị ka okpomọkụ dị elu, mbelata mmiri, mfu nke ụdị dị iche iche, na mmụba nke ọrịa, na-emetụta ụzọ ndụ. Enweghị mmata, ọkachasị n'etiti obodo ndị na-enweghị agụmakwụkwọ, na-enye aka n'omume ndị na-eme ka nsogbu ahụ ka njọ. Ịkpali ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ụmụ akwụkwọ na ụlọ akwụkwọ tertiary nke Naijiria maka mmata banyere mgbanwe ihu igwe nwere ike ịbụ ihe ngwọta dị mkpa, na-akwalite ikike mgbanwe na usoro ndụ na-adịgide adịgide maka mpaghara ahụ. .[14]

Mmetọ ikuku

dezie

Jalingo nwere nnukwu ihe ize ndụ ahụike site na ụmụ irighiri ihe ndị dị n'ikuku, ọkachasị uzuzu, nke nwere ike ịbanye n'ime akụkụ miri emi nke akpa ume ma mee ka ụkwara ume, bronchitis, na ọnọdụ akpa ume ndị ọzọ. [15] [16][17][18]

Hụkwa

dezie
  • Ụlọ Ọgwụ Federal, Jalingo
  • Mahadum steeti Taraba

Edensibia

dezie
  1. The World Gazeteer. Archived from the original on 2013-02-09. Retrieved on 2007-04-06.
  2. Shimizu (1979). A Comparative Study of the Mumuye Dialects (Nigeria), Marburger Studien zur Afrika- und Asienkunde. Berlin: Verlag von Dietrich Reimer, 13–19. 
  3. Royal (2020-06-09). Taraba holds LG election June 30 (en-GB). Vanguard News. Retrieved on 2022-12-31.
  4. Report (2017-02-27). PDP sweeps elections in Taraba, Gombe, Rivers (en-GB). Premium Times Nigeria. Retrieved on 2022-12-31.
  5. 5.0 5.1 admin (2022-07-03). PRESS RELEASE: Gov. Ishaku Approves the Dissolution of Local Government Councils (en-GB). TARABA STATE GOVERNMENT. Archived from the original on 2022-12-31. Retrieved on 2022-12-31.
  6. admin (2022-07-01). PRESS RELEASE: LGA Chairmen, Councillors Tenures Ends in Few Days (en-GB). TARABA STATE GOVERNMENT. Archived from the original on 2022-12-31. Retrieved on 2022-12-31.
  7. NNN (2022-09-06). Ex-Taraba primary healthcare secretary assumes office as LG chairman (en). NNN. Archived from the original on 2022-12-31. Retrieved on 2022-12-31.
  8. Fuel scarcity, high food prices, others may mar Yuletide in Taraba (en-US). The Guardian Nigeria News – Nigeria and World News (2022-12-23). Retrieved on 2022-12-31.
  9. says (2022-08-19). Mu’azu Jaji Sambo, an Unassuming Achiever (en-US). Retrieved on 2022-12-31.
  10. 10.0 10.1 10.2 10.3 10.4 10.5 10.6 10.7 Jalingo Climate, Weather By Month, Average Temperature (Nigeria) - Weather Spark (en). weatherspark.com. Retrieved on 2023-07-09."Jalingo Climate, Weather By Month, Average Temperature (Nigeria) - Weather Spark". weatherspark.com. Retrieved 9 July 2023.
  11. Jalingo Annual Weather Averages (en). WorldWeatherOnline.com. Retrieved on 2023-07-09.
  12. Atlas. Jalingo, Nigeria - Yearly & Monthly weather forecast (en). Weather Atlas. Retrieved on 2023-07-09.
  13. 13.0 13.1 Jalingo, Taraba, Nigeria 14 day weather forecast (en). www.timeanddate.com. Retrieved on 2023-07-09."Jalingo, Taraba, Nigeria 14 day weather forecast". www.timeanddate.com. Retrieved 9 July 2023.
  14. Orunonye (4 September 2011). "Assessment of the level of awareness of the effects of climate change among students of tertiary institutions in Jalingo Metropolis, Taraba State Nigeria". Journal of geography and regional planning 4 (9): 513–517. ISSN 2070-1845. 
  15. Air Quality & Pollen Forecast for Jalingo (en). meteoblue. Retrieved on 2023-09-24.
  16. Jalingo Air Quality Index (AQI) and Nigeria Air Pollution | IQAir (en). www.iqair.com (2023-09-24). Retrieved on 2023-09-24.
  17. Jalingo, Nigeria Air Quality & Pollen | Weather Underground. www.wunderground.com. Retrieved on 2023-09-24.
  18. Air Quality and Pollen in Jalingo, Taraba State, Nigeria | Tomorrow.io (en). Tomorrow.io Weather. Retrieved on 2023-09-24.