Iwu ọrụ ugbo
Iwu ọrụ ugbo n'akọwa usoro iwu metụtara ọrụ ugbo n'ụlọ na mbubata ngwa ahịa ugbo mba ọzọ. Gọọmentị n'emekarị ka iwu ọrụ ugbo na ebum n'uche nke inweta nsonaazụ a kapịrị ọnụ na ahịa ngwaahịa ugbo. Iwu ọrụ ugbo a haziri nke ọma n'eji ebum n'uche, na ụzọ ndị mmadụ ma ọ bụ gọọmentị setịpụrụ maka ebum n'uche nke inweta nsonaazụ a kapịrị ọnụ, maka abamuru nke onye ọ bụla, ọha mmadụ na akụ na ụba mba n'ozuzu. Ihe mgbaru ọsọ ndị ahụ nwere ike ịgụnye okwu ndị dị ka nchekwa ndụ, nchekwa nri, mbelata ịda ogbenye n'ime obodo ma ọ bụ ịbawanye uru akụ na ụba site na ihe ọkụkụ ego ma ọ bụ nkesa nri ka mma ma ọ bụ Nhazi nri.
Iwu ọrụ ugbo na-eburu n'uche usoro nke mbụ (mmepụta), nke abụọ (dị ka nhazi nri, na nkesa) na nke atọ (dị ka oriri na inye ngwa ahịa na ihe ọkụkụ). Nsonaazụ nwere ike ịgụnye, dịka ọmụmaatụ, ọkwa nkwụsi ike, ọnụahịa, ogo ngwa ahịa, nhọrọ ngwa ahịa, ojiji ala ma ọ bụ ọrụ. Gọọmentị nwere ike iji ngwaọrụ dịka Omume mmepe ime obodo, mgbatị ọrụ ugbo, nchebe akụ na ụba, enyemaka ọrụ ugbo ma ọ bụ njikwa ọnụahịa iji gbanwee usoro mmepụta ugbo, ma ọ bụ melite mmetụta ndị ahịa nke mmepụta.
Iwu ọrụ ugbo nwere mmetụta dị ukwuu na nke abụọ. Ọrụ ugbo nwere mmetụta dị ukwuu na mgbanwe ihu igwe, nke a n'eme atụmatụ na ọ na-enye aka na 20-25% nke ikuku zuru ụwa ọnụ kwa afọ ka ọ na-erule n'afọ 2010.[mkpa mmelite] N'otu aka ahụ, iwu ọrụ ugbo chọrọ ịkọwa ọtụtụ ihe mgbagwojụ anya na usoro ahụ: dịka ọmụmaatụ, ọrụ ugbo na-emetụta mmetụta ọjọọ nke mgbanwe ihu igwe, dị ka mbelata nke mmiri, usoro geophysical dị ka ịrị elu nke oke osimiri na mgbanwe ihu igwe. Iji Mbelata mgbanwe ihu igwe zuru ụwa ọnụ na ime mgbanwe iji dị irè, ọ dị mkpa itinye n'ọrụ ọtụtụ iwu iji belata ihe ize ndụ nke mmetụta mgbanwe ihu igwe n'adịghị mma na ọrụ ugbo na ikuku na-ekpo ọkụ site na ngalaba ọrụ ugbo. [lower-alpha 1]