Isianyaọcha
ọrịa ọrịa, class of disease
obere ụdị nkefilariasis, parasitic helminthiasis infectious disease, neglected tropical disease, disease Dezie
ihe kpatara yaOnchocerca volvulus Dezie
health specialtyinfectious diseases, tropical medicine Dezie
drug or therapy used for treatmentivermectin, ivermectin Dezie
usoro nnyefe ọrịainsect borne transmission Dezie
ICD-9-CM125.3 Dezie
NCI Thesaurus IDC34861 Dezie

Onkosisiasis nke amakwa dịka isianyaọcha na Rọbụl nke okpo ọjọọ nọ n'ime ahụ n'akpata. Onkosesa Volvulus bụ okpo,nke okpo Onkosera Volvulus n'akpata.[1] Ihe ejiri amata ya gụnyere ịkọ ọkọ oge niile, otito n'ime ahụ na ikpu isi.[1] Oso n'otu n'ime ihe kasị akpata ikpu isi, n'ihi ịbanye n'ime ahụ, nke n'akpata isianyaọcha.[2]

Isianyaọcha
Nhazi na ihe ndị enwetara n’ime
ICD-10B73
ICD-9125.3
DiseasesDB9218
MeSHD009855

Okpo n'ekesa ya n'esi n'ijiji nke dị oji nke Simulium.[1] Ijiji ahụ n'atakarị tupu nkesa ya ebido.[3] Ijiji ndị a n'ebikarị n'akụkụ mmiri, nke mere eji nye ọrịa a aha ahụ.[2] Mgbe ọbụla ọnọ n'ime ahụ mmadụ, ọ na-eyi akwa nke n'eji nwayọ kesaa n'ahụ niile.[1] Nke ga-abanyekwa n'ime ijiji ọzọ nọ nso nke tarala mmadụ[1] Onwere ụzọ dị iche iche enwere ike isi chọpụta ya, ha gụnyere:itinye mmiri nnu n'ime ahụ ma n'ele anya ka akwa ya ahụ ga-eji nwayọ pụta, gosi nwa ya na okpo ndịọzọ buru ibu.[4]

Onwebeghị ọgwụ mgbochi enwere maka ya.[1] Mgbochi doro anya enwere maka ya ugbu a bụ izere ijiji ahụ ịta mmadụ.[5] Ihe ndịọzọ gụnyere ịgba ọgwụ n'egbu ijiji n'iyichi ahụ nkeọma.[5] Mgbalị ndịọzọ doro anya enwere ike ime bụ ibelata ọtụtụ ijiji n'akụkụ ebe obibi n'ịgba ọgwụ n'egbu ha.[1] Mbaụwa n'etinye mgbalị ịhụ na-enyere ọgwụ mgbochi ugboro abụọ kwa afọ, nke a n'aga n'ihu ugbu a.[1] Eji ọgwụ ịvametin agwọ ndị oji ọnwa isii ruo ọnwa iri na abụọ.[1][6] Naanị akwa ya k'ọna-egbu. Ọ naghị egbu nke ọbụla tozurula oke.[7] Mana ọgwụ Dozisaịklin, nke n'egbu nje a akpọrọ Wolbakịa, n'emekpa okpo ndị a tozurula oke ahụ. Ọ na enye aka n'ụzọ pụrụ iche. Ọtụtụ ekwuola okwu maka ya nke ukwuu.[7] Iwepu otito maọbụ akpụ ndị ahụ gbapụtara n'ime ahụ ga-enyekwa aka.[6]

Ihe ruru nde mmadụ 17 ruo 25 nwere nsogbu isianyaọcha, nke ihe fọrọ nke nta k'ọbụrụ otu nde enweela nsogbu anya n'ụdị ya dị iche iche.[3][7]Ebe ọrịa kasị bụ na Afrịka. Ọbụ eziokwu n'enweela ihe ndeko enwere na Yemen n'ebe ụfọdụ dịpụrụ adịpụ na Sentral Amerịka na Sawụtụ Amerịka.[1] N'afọ 1915, onye dibia bekee bụ Rodọlf Rọbụls mere nchọpụta na nje a bụ ya n'ekesa isianyaọcha.

Ebe akpọtụrụ uche dezie

  1. 1.00 1.01 1.02 1.03 1.04 1.05 1.06 1.07 1.08 1.09 Onchocerciasis Fact sheet N°374. World Health Organization (March 2014). Retrieved on 20 March 2014.
  2. 2.0 2.1 Onchocerciasis (also known as River Blindness). Parasites. CDC (May 21, 2013). Retrieved on 20 March 2014.
  3. 3.0 3.1 Parasites – Onchocerciasis (also known as River Blindness) Epidemiology & Risk Factors. CDC (May 21, 2013). Retrieved on 20 March 2014.
  4. Onchocerciasis (also known as River Blindness) Diagnosis. Parasites. CDC (May 21, 2013). Retrieved on 20 March 2014.
  5. 5.0 5.1 Onchocerciasis (also known as River Blindness) Prevention & Control. Parasites. CDC (May 21, 2013). Retrieved on 20 March 2014.
  6. 6.0 6.1 Murray, Patrick (2013). Medical microbiology, 7th, Philadelphia: Elsevier Saunders. ISBN 9780323086929. 
  7. 7.0 7.1 7.2 Brunette, Gary W. (2011). CDC Health Information for International Travel 2012 : The Yellow Book. Oxford University Press. ISBN 9780199830367.