Isaac Fola-Alade
ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
aha enyere | Isaac |
ụbọchị ọmụmụ ya | 24 Novemba 1933 |
Ebe ọmụmụ | Ȯra Ekiti |
Ụbọchị ọnwụ ya | 19 Jụn 2021 |
ọrụ ọ na-arụ | onye na-ese ụkpụrụ ụlọ |
ebe agụmakwụkwọ | Ahmadu Bello University, Christ's School Ado Ekiti |
nnọchiaha nkeonwe | L485 |
Chief Isaac Folayan Alade, FNIA, D.Sc, OFR (24 Nọvemba 1933 - 19 Juun 2021) bụ onye ala Naijiria na-arụ ụlọ.[1][2]
Akụkọ ndụ
dezieAgụmakwụkwọ
dezieIsaac gụrụ akwụkwọ na St Phillips Elementary School na Aramoko, Ekiti na Christ's School, Ado Ekiti maka agụmakwụkwọ sekọndrị ya. N'afọ 1961, ọ gụsịrị akwụkwọ na Nigerian College of Arts & Sciences and Technology Zaria (nke bụzi Ahmadu Bello University) dịka otu n'ime ndị ọsụ ụzọ anọ mbụ gụsịrị akwụkwọ na ngalaba Architecture. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ gụsịrị akwụkwọ na Architectural Association School of Tropical Studies, London na 1965, na Commonwealth Scholarship.[3]
Ọrụ
dezieMgbe ọ nwetachara ọzụzụ ọkachamara, ọ ghọrọ onye mmekọ nke Royal Institute of British Architects (R.I.B.A.) na Architects' Registration Council of the United Kingdom (ARCUK) na 1963. Ọ sonyeere Federal Ministry of Works and Housing dị ka onye na-arụ ụlọ na mpaghara ọdịda anyanwụ ochie na mgbe e mesịrị Lagos City Council. N'afọ 1969, ọ bụụrụ onye mbụ na-edebanye aha na Architects Registration Council of Nigeria (ARCON). O mechara sonye na Federal Civil Service. Ọ ghọrọ onye otu Royal Society of Health of the UK (F.R.S.H.) na 1965. Ọ ghọrọ Chief Project Architect na 1972, na Director of Public Buildings na 1975. Ọ bụ onye mbụ Architect ghọrọ Federal Permanent Secretary na 1976, ọkwa ọ nọrọ ruo mgbe ọ lara ezumike nká na 1979 mgbe nke ahụ gasịrị, o guzobere ọrụ onwe ya Fola Alade Associates na 1979. Ọ rụrụ ọrụ ddka odeakwụkwọ ukwu na Nigerian Institute of Architects . A họpụtara ya ka ọ bụrụ Pro-Chancellor na Chairman Governing Council nke Federal University of Port Harcourt n'afọ 1990. E nyere Fola Alade OFR wee bụrụ onye otu Nigerian Institute of Architects . O nwekwara ọtụtụ aha otutu ọdịnala gụnyere Maiyegun nke Aramoko.
Ndụ onwe
dezieFola Alade lụrụ Yemi n'afọ 1961. Ha mụtara ụmụ ise.[4] Fola Alade gafere na June 19 th 2021 mgbe ọ dị afọ iri asatọ na asaa[5]
Ọrụ ndị a họọrọ
dezie- 1004 Housing Estate, Victoria Island, Lagos.
- Federal Secretariat building, Ikoyi, Lagos.
- National Stadium, Lagos
- Remembrance Arcade, Tafawa Balewa Square, Lagos.[1]
- Satellite Town, Lagos
- Nigerian Airforce base, Ikeja.
- Nigerian Institute of Policy and Strategic Studies building, Kuru, Plateau State.
- National Judicial institute, Abuja.
- Ụlọ ọrụ Embassy nke Naijiria nakwa mba iri na otu.[6][7][3][8][9][10][2][11]
Edemsibịa
dezie- ↑ 1.0 1.1 E. K. Akintoye (2001). Nigerian Bureaucracy: Development, Ecology & Management. Alsun International. ISBN 9789783607903.
- ↑ 2.0 2.1 Isaac Fola-Alade. Biographical Legacy and Research Foundation. Retrieved on 26 September 2018.
- ↑ 3.0 3.1 EKITI LAUREATE: Chief (Architect) Isaac Fola Alade, OFR. FNIA, D.Sc. Hons. THE ASIWAJU Of ARAMOKO-EKITI. Ekiti Defender. Archived from the original on 27 September 2018. Retrieved on 26 September 2018.
- ↑ Dipo Ajayi (2004). This I Believe: The Philosophies and Personal Histories of 24 Eminent Nigerian Achievers. Prestige Associates (Indiana University). ISBN 9789780622145.
- ↑ "Designer of 1004 Flats Housing Estate is Dead", Premium Times.
- ↑ Nathaniel Motunbade Adeyemi (1996). The National Institute for Policy and Strategic Studies :: the story so far (1979-1995). Kraun Publishers. ISBN 9789783153721.
- ↑ (2003) "Isaac Fola Alade". Tell Magazine (44-49; 52).
- ↑ Raph Uwechue (1991). Africa Who's who (Know Africa). Africa Journal Limited. ISBN 9780903274173.
- ↑ Olugbemi Fatula (2000). 2000 Foremost Nigerians: 200 profiles. Caltop Publications, 129–131. ISBN 9789782066138.
- ↑ Bankole Makinde (2001). Who's who in Nigeria. Newswatch. ISBN 9789782704122.
- ↑ "Nigeria: Indigenes Charged On Community Development", AllAfrica, ThisDay, 19 April 2006. Retrieved on 26 September 2018.