N'ihe gbasara ọgwụ bekee, ime nchọpụta bụ uzọ e si a mata ọrịa ma ọ bụ ọnọdụ na-akọwa ihe a hụrụ n'ahụ mmadụ mere na ahụ adịghị ya.Ihe ndị a na-achọ mgbe a na-eme nchọpụta a na abụkarị site n'ihe onye ahụ adịghị kwuru banyere onwe ya nakwa site n'ihe a hụrụ mgbe e nyochara ya ahụ. Oge ụfọdụ, a na-emekwa usoro nchọpụta otu ugboro ma ọ bụ karịa dịka ime test dị iche iche. Oge ụfọdụ kwa, a na-ahụkwa nnyocha onye nwụrụ anwụ dịka ụdị ime nnyocha e nwere. Ime nnyocha na-esi ike oge ụfọdụ maka na ọtụtụ ihe ndị a hụrụ n'ahụ onye bịara ụlọ ọgwụ anaghị edocha anya. Ọmụmatụ bụ ahụ mmadụ ịcha mmee mmee, nke nwere ike ịbụ akara ọtụtụ ọrịa. Ọ naghị ekwu kpọmkwem ihe na-eme onye ahụ.

Usoro dezie

Ihe ndị a na-eme n'usoro nchọpụta a kacha mara maka ha gụnyere:

  • Inwete ihe ndị e kwesịri imata banyere onye ahụ adịghị, nke nwere ike ịgụnye ajụjụ banyere ọrịa o rịagoro na mbụ (nke e nwere ike inwete n'aka onye ya na onye ahụ adịghị nọ nso), ile ya anya n'ahụ na ime test nnyocha dị iche iche. Ime test nnyocha bụ ụdị test ọbụla e mere i ji were nye aka na nnyocha a na-eme ịchọpụta ọrịa. E nwere ike i si na ya mata ihe nwere ike ibute ọrịa ndị mmadụ na-arịa.[1]
  • Inyocha ọsịsa e nwetere, ihe a chọpụtara na mpụtara ndị ọzọ. E nwekwara ike kpọtụrụ ndị ọkachamara banyere ihe na-eme onye ahụ.

E nwere ụzọ dị iche iche e nwere ike i si were mee nnyocha, tinyere ime nnyocha iji mata ihe dị iche ma ọ bụ iso usoro na-achị ihe niile gbasara ọgwụ bekee.[2] Ka o si dị, usoro ime nnyocha nwere ike ịgụnye ọtụtụ usoro.[3]

Nnyocha Covid-19 dezie

Ibute nje korona bụ nke e nwere ike ịchọpụta site na njirimara ọrịa a. Mana, a ga-eji n'aka n'ọbụ ya site n'ime mmụba nje nke bekee kpọrọ reverse transcription polymerase chain reaction (rRT-PCR) n'ihe dịka mmiri si n'ahụ onye ọrịa pụta ma ọ bụ ihe onyinyo CT. [4] [5] Nchọcha tụlere PCR na CT na Wuhan na-egosi CT ka PCR mma, mana ọnaghị edocha anya n'ihi ọtụtụ onyinyo na-adị n'elu nimonia na ọrịa ndị ọzọ. [2] Ka ọ dị na Mach 2020, Koleji Amerika na-amụ Rediolọjị kwuru na "agaghị eji CT were mee nnyocha COVID-19 mbụ." [6]

Ime test nje dezie

WHO ewepụtala ọtụtụ ụzọ e si eme test RNA maka nje korona, nke ha wepụtara izizi na Jenuwarị 17. [7][8][9] Test nke a na-agbaso reverse transcription polymerase chain reaction(rRT-PCR).[10] E nwere ike ime ya n'ihe e wepụtara n'imi ma ọ bụ ọnụ ma ọ bụ n'ọbara. [11] Mpụtara na-adị awa olemọle eji were me ya, [12][13] Ana-emekarị test nke a n'ihe a kọchapụtara n'akpo. E nwekwara ike i ji nke akọchapụtara n'akpịrị were mee ya. [14]

Ọtụtụ labọlatrị na ụlọ ọrụ dị iche iche na-emepụta ihe e ji enyocha ọbara i ji hụ ihe ekwesịghị ịdị n'ahụ mmadụ.[15] Ka ọ dị n'Eprel 6 2020, onwebeghị nke e kwuru na ọ dị mma maka iji nyochawa ndị mmadụ. [16] Na mba US, naanị ndị ọrụ labọratrị e nyere ikike ga-eji ihe nnyocha ọbara Cellex mepụtara were na-eme test.[17]

Inyo onyinyo dezie

Njirimara ihe onyinyo rediograf na CT (computed tomography) nke ndi nwere njirimara nje korona gụnyere asymmetric peripheral ground glass opacities ya na enweghị ihe na-aga na ahụ akpịrị. [18] Otu ndi Rediografi n'Itali na-achịkọta onyinyo niile e sere ndị nwere nje korona n'ọnlaịn.[19] Maka ihi na ya na ọrịa ụfọdụ dịka nje adeno yiri onwe ha, ise onyinyo ejighị PCR were mata ma nje korona adị ya bụ nke siri ike na nchọpụta COVID-19.Nnukwu nchọcha e mere na Chaịna tụlere mpụtara obi e sere CT na PCR were sị na na-agbanyeghị na ọnaghị egosicha kpọmkwem ma onye e sere ya o bu nje korona, ọ ka mma iji were na-eme nnyocha ebe ọrịa a gazuru ọtụtụ ebe. Ihe e ji enyocha onyinyo nke bekee kpọrọ convolutional neural network bụ nke e mepụtara maka ihụ nje na rediograf [20] na CT.[21]

Referencing dezie

  1. Thompson, C. & Dowding, C. (2009) Essential Decision Making and Clinical Judgement for Nurses.
  2. "Making a diagnosis", John P. Langlois, Chapter 10 in Fundamentals of clinical practice (2002). Mark B. Mengel, Warren Lee Holleman, Scott A. Fields. 2nd edition. p. 198. ISBN 0-306-46692-9
  3. "Making a diagnosis", John P. Langlois, Chapter 10 in Fundamentals of clinical practice (2002). Mark B. Mengel, Warren Lee Holleman, Scott A. Fields. 2nd edition. p. 204. ISBN 0-306-46692-9
  4. "CT provides best diagnosis for COVID-19". ScienceDaily. Retrieved 14 March2020.
  5. Ai T, Yang Z, Hou H, Zhan C, Chen C, Lv W, et al. (February 2020). "Correlation of Chest CT and RT-PCR Testing in Coronavirus Disease 2019 (COVID-19) in China: A Report of 1014 Cases". Radiology: 200642. doi:10.1148/radiol.2020200642. PMID 32101510.
  6. "ACR Recommendations for the use of Chest Radiography and Computed Tomography (CT) for Suspected COVID-19 Infection". American College of Radiology. 22 March 2020.
  7. Laboratory testing of 2019 novel coronavirus (2019-nCoV) in suspected human cases: interim guidance, 17 January 2020 (PDF) (Report). World Health Organization. 17 January 2020. hdl:10665/330676. ISBN 9789240000971.
  8. Laboratory testing for coronavirus disease 2019 (COVID-19) in suspected human cases: interim guidance, 2 March 2020 (PDF) (Report). World Health Organization. 2 March 2020. hdl:10665/331329. WHO/COVID-19/laboratory/2020.4.
  9. "Coronavirus disease (COVID-19) technical guidance: Laboratory testing for 2019-nCoV in humans". World Health Organization. Archived from the original on 15 March 2020. Retrieved 14 March 2020.
  10. "Coronavirus Disease 2019 (COVID-19) Situation Summary". US Centers for Disease Control and Prevention. 30 January 2020. Archived from the original on 26 January 2020. Retrieved 30 January 2020.
  11. "Real-Time RT-PCR Panel for Detection 2019-Novel Coronavirus". U.S. Centers for Disease Control and Prevention (CDC). 29 January 2020. Archived from the original on 30 January 2020. Retrieved 1 February 2020.
  12. Brueck H (30 January 2020). "There's only one way to know if you have the coronavirus, and it involves machines full of spit and mucus". Business Insider. Archived from the original on 1 February 2020. Retrieved 1 February 2020.
  13. "Curetis Group Company Ares Genetics and BGI Group Collaborate to Offer Next-Generation Sequencing and PCR-based Coronavirus (2019-nCoV) Testing in Europe". GlobeNewswire. 30 January 2020. Archived from the original on 31 January 2020. Retrieved 1 February 2020.
  14. "Coronavirus Disease 2019 (COVID-19)". Centers for Disease Control and Prevention. 11 February 2020. Retrieved 5 April 2020.
  15. Vogel G (19 March 2020). "New blood tests for antibodies could show true scale of coronavirus pandemic". Science | AAAS. Retrieved 6 April 2020.
  16. "Coronavirus antibody tests: How they work and when we'll have them". BBC Science Focus Magazine. Retrieved 6 April 2020.
  17. Azad A. "FDA authorizes first coronavirus antibody test". CNN. Retrieved 6 April2020.
  18. Li Y, Xia L (March 2020). "Coronavirus Disease 2019 (COVID-19): Role of Chest CT in Diagnosis and Management". AJR. American Journal of Roentgenology: 1–7. doi:10.2214/AJR.20.22954. PMID 32130038.
  19. "COVID-19 DATABASE | SIRM" (in Italian). Retrieved 11 March 2020.
  20. Heaven WD. "A neural network can help spot Covid-19 in chest x-rays". MIT Technology Review. Retrieved 27 March 2020.
  21. Li L, Qin L, Xu Z, Yin Y, Wang X, Kong B, et al. (March 2020). "Artificial Intelligence Distinguishes COVID-19 from Community Acquired Pneumonia on Chest CT". Radiology: 200905. doi:10.1148/radiol.2020200905. PMID 32191588.