Ikpirikpi Ọgụ

Udidi egwu

Ikpirikpi ọgụ bụ egwu na-ewu ewu a na agba n'ọtụtụ ebe na Ọwụwa Anyanwụ Nigeria . [1] Egwu a, ntọnala ya si na obodo Ohafia, ọ bụ ndi dimpka bu akpụ-obi na agba ya igosị ike ha na igba dimkpa na agha na oge gbo. [2]

Ohafia War Dance entertainers na olili ozu na Enugu .

Mbido dezie

Dika etu esi kọ akụkọ ya, ndị nna nna Ohafia bụ ndị ama- ama dị ka ndị dimkpa na-agha ndị nọ na njikere mgbe niile isonye na agha. [3] Ọdinala ndi agha Ohafia nke bụ otu n'ime njirimara ndi Ọhafia gbadoro ụkwụ na emume ngosị nke ikpirikpi ogu - omume nke igbupu isi ndi iro emeriri na-agha. Okpukpụ isi mmadu bu ihe akaebe nke nwoke kara obi ma nwe ike. Ọ bụ naanị ndị bu isi lọta agha na-esonye na otu ndị Ogbu-isi ma na-eyi abuba ugo nke bụ akara ika-obi. [4]

Emume ngosị dezie

 
Otu ndi Ohafia War Dance nke onye ndu ha

Ikpirikpi ọgụ nke a na-eji kwa eme mmeme ntụrụ-ụgo mmadu bụ onye isi egwu bu ekete ọkpụkpụ isi mmadu juru (oyaya) na-ebu ụzọ, ọ na ejide nma ọgbu-ada na-aka ma kpụrụ ọmụ nkwu na-ọnụ. Ndi otu ha ndi ọzọ na eji-ngwa ka ndi na-aga ọgụ, na enomi etu esi egbupu mmadu isi ma na agba egwu si na akụrụ-ngwa akwatankwa ma na-egosị na ndi ala Ọhafia ndi agha nwere kara obi. [5]

Nrutuaka dezie

  1. Ofo Ndigbo: Nri ancient kingdom stands still for Ukiwe. The Sun (30 July 2014).
  2. Interview: Leonard Ndubueze Mbah and ‘Emergent Masculinities’. Wenner Gren (20 November 2012). Archived from the original on 7 September 2015. Retrieved on 2 October 2020.
  3. History of Ohafia People and Culture. LogBaby.
  4. Interview: Leonard Ndubueze Mbah and ‘Emergent Masculinities’. Wenner Gren. Archived from the original on 2015-09-07. Retrieved on 2020-10-02.
  5. McCall, John (1993). Dancing the past: experiencing historical knowledge in Ohafia, Nigeria. Ann Arbor, Michigan: MPublishing, University of Michigan Library, 8–9.