Ijeoma Ndukwe-Egwuronu
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
aha enyere | Ijeoma |
ụbọchị ọmụmụ ya | 12 Mee 1982 |
Ebe ọmụmụ | Owẹrrẹ |
ọrụ ọ na-arụ | onye ọchụnta ego |
Ebe obibi | Abuja |
Ijeoma Ndukwe-Egwuronu ( Amụrụ Ijeoma Ndukwe-Egwuronu; ka ọnwa nke ise di na mkpụrụ ubochi iri na abụọ n'afọ 1982 Obu nwa afọ Naijiria ọchụnta ego amara maara dị ka Nwanyi Akamụ ( Aha ana-akpọ nwaanyi na-ele Akamụ na okwu Igbo) ma ọ bụ Iyaologi (okwu Yoruba maka nwanyị na ele akamụ) iji tụnere azụmahịa nhazi nri ya akpọrọ, Bubez Foods. [1]
Mmalite ndụ na mmụta
dezieIjeoma toro na Owerri, Imo Steeti. Ọ bụ nwa izizi n’ezinaụlọ isii. Omalitere ịgụ akwụkwọ ya na Assumpta Primary School, Owerri tupu ọ gaa ụlọ akwụkwọ di elu na Owerri Girls Secondary School. Omechakwara , ga Mahadum nke Calabar ebe onwetara akara ugo mmuta bachelor na Human Physiology. [2]
Nchụso Azụmaahịa
dezieIjeoma hiwere Bubez Plaiz, ụlọ ahịa na-ere ahịa n'afọ 2004 wee zụa ahịa ahụ afọ asatọ tupu ọpachie ya n'afọ 2012 n'ihi ụgwọ ọjọọ azụmahịa. Site n 'ajụjụ ọnụ ọ nyere mbipụta Guardian (mbipụta nke Naijiria), Ijeoma "gakwuuru Chukwu n'ekpere na-achọ azịza" na nsogbu ya nke mmimi ya be ulo azụmahịa Bubez Foods na-eji oka dị ka isi akụrụngwa, . [3] Kemgbe ahụ, ọ nwalere ọtụtụ ụdị dị iche iche nke mbinye aka ngwaahịa ya, akamụ ma ugbu a nwere ihe karịrị ihe asaa di iche iche iche nke Bubez Pap Mixed Grains Paste. [4] Ijeoma nwere mmasị na inye ike ụmụ nwanyị ma na mkparịta ụka ya na Vanguard (Nigeria), kwuru na "ụmụ nwaanyị na-arụ ọrụ ha nke ọma nke kwesiri ka enye ha ohere kwesiri ekwesi n' akụkụ ọrụ obụla ha họọrọ". [5]
Akamgba Nchụso Azụmaahịa
dezieIjeoma kwesiri ike na nchekwa nke ngwaahịa na ngwaahịa emechelara bụ otu n'ime Akamgba kachasị na usoro akụkụ oriri na akụkụ ego nke Naijiria . [6]
Ntughari
dezie
- ↑ Leading Ladies. "Ijeoma Ndukwe-Egwuronu".
- ↑ "I ran a high end boutique for 8 years before I ventured into selling akamu (pap) - Mrs. Ijeoma Ndukwe-Egwuronu. CEO, Bubez Foods". Retrieved on 5 May 2017.
- ↑ Leading Ladies. "Ijeoma Ndukwe-Egwuronu".
- ↑ Ajumobi. "Face your fears and do it anyway – Ijeoma".
- ↑ Nosike. "‘Let’s develop our traditional foods with research, modern technology’".
- ↑ Africa. "Bubez Foods boss on Nigeria’s agriculture value chain challenges".