Ihe odide Angus McBride nke Middle-earth

Angus McBride's Characters of Middle-earth bụ mgbakwunye egwuregwu nke ndị Iron Crown Enterprises (I.C.E.) bipụtara n'afọ 1990 maka usoro egwuregwu ha nke Middle-earth Role Playing (MERP) nke dabeere na Lord of the Rings nke J. R. R. Tolkien.

Usòrò:Angus McBride's Characters of Middle-earth.jpg

Ndinaya

dezie

Characters of Middle Earth nke Angus McBride bụ nchịkọta nke ihe osise dị iri abụọ na itoolu nke onye na-ese ihe na South Africa [1] bụ Angus Mcbride sere nke ndị so mee ihe nkiri The Lord of the Rings dị mkpa dị ka Gandalf, Treebeard, na Galadriel, ya na ihe odide sitere na akwụkwọ MERP. A na-ebipụta ihe osise ọ bụla na-acha anụnụ anụnụ na akwụkwọ na-egbuke egbuke, ma na-ebu nkọwa nke àgwà esere ya na ebe egosiri na ihe osise ahụ, yana ọnụ ọgụgụ egwuregwu maka agwa ahụ.[2]

Nnabata

dezie

Na mbipụta nke Ọgọst 1991 nke Dragọn (Mbupụta #172), Allen Varney bụụrụ onye na-akọwa onwe ya dị ka onye na-akwado ǹkà Angus McBride, na-akpọ ya "onye kachasị amasị m n'etiti ndị na-ese ihe osise nke ọrụ J.R.R. Tolkien. " Varney kọwara mbipụta a dị ka "akwụkwọ dị egwu nke ezigbo ǹkà mara mma"; mana o nyere mkpịsị aka ala (ńkátọ̀) maka "onye na-adịghị ike na-eche ihe osise ọ bụla ihu. Harad tụụrụ ndị ọzọ ihu.[1] Varney dụrụ ndị na-agụ akwụkwọ ahụ ọ́dụ̀ ka ha "mafere njuku egwuregwu dị na ya ma mee ka onyonyo ha na-eweta n'ihe ha nwee ọdịdị. Ọ katọkwara ịdị ọnụ nke isiokwu ndị esi na orụ Tolkien weta, nakwa ịdị n'uju nnukwu nke "okwuchi ndị sitere na mgbakwunye ndị [MERP] gbasara Harad dị nso, Harad dị anya, Harad dị ezigbo anya na-eweta ịda mba, nakwa azụmmiri ndị ọzọ na-etorughi akụkọ kachasị nta maka ha na The Lord of the Rings

Ntụle

dezie
  • White Wolf #25 - (Feb 1991)

Edensibia

dezie
  1. 1.0 1.1 Varney (August 1991). "Roleplaying Reviews". Dragon (172): 30.  Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "dragon172" defined multiple times with different content
  2. Angus McBride's Characters of Middle-earth - RPGnet RPG Game Index. index.rpg.net.

Àtụ:Middle-earth Role Playing