Hope Nakazibwe Grania

Hope Nakazibwe Grania
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1985 Dezie

Hope Nakazibwe Grania bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Uganda, na onye sayensị na-ahụ maka ụlọ nyocha. Ọ bụ nwanyị nọ ugbu a na nzuko omeiwu nke Mubende District. Hope lụrụ Andrew Abaasa.

Ihe ndị mere n'oge gara aga dezie

A mụrụ ya na 20 Jenụwarị, na afọ 1986, nwa Hindia Mpuuga na Norah Mbabazi nke Mubende District.[1]

Agụmakwụkwọ dezie

Ọ gara ụlọ akwụkwọ praịmarị Tiger Army na Mubende District maka agụmakwụkwọ elementrị na afọ 1999, Kasenyi SS Mubende na maka agụmakọta ya nkịtị na Christ the King Mulinda maka agụmakmakwụkwọ ya dị elu.[1] Hope nwere diplọma na sayensị ụlọ nyocha ahụike site na Makerere Paramedical School Mulago (2008), O nwekwara nzere bachelọ na sayensụ ụlọ nyocha ahụ ike site na Mahadum Sayensị na Teknụzụ nke Mbarara ebe ọ meriri ihe nrite dị ka nwa akwụkwọ kachasị mma nke afọ 2012. O nwekwara nzere masta nke ahụike ọha na eze site na Mahadum Uganda Martyrs na asambodo na Biomedical scientific manuscript ederede site na ọnwa Machị California San Francisco USA.

Akụkọ ihe mere eme nke ọrụ dezie

Hope jere ozi dị ka onye na-ahụ maka teknụzụ na ụlọ ọgwụ Mengo n'afọ 2008. N'agbata afọ 2009 na 2010, ọ rụrụ ọrụ dị ka onye nlekọta ụlọ nyocha na Integrated Community Based Initiatives (ICOBI) na mpaghara Mubende na Kassanda. Ọ rụkwara ọrụ dị ka onye nlekọta ụlọ nyocha ICOBI Kampala Central Division na 2013. Ọ sonyeere Uganda Virus Research Institute / Medical Research Council na London School of Hygiene and Tropical Medicine na afọ 2013, na-eduga; ngalaba hematology afọ 2013-2015, Biochemistry afọ 2015-2016, Molecular afọ 2017-2020 ma sonye na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na afọ 2020.

Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị dezie

N'afọ 2020, Hope Nakazibwe Grania sonyere na Mubende District Women's Constituency na tiketi ndọrọ ndọrọ ọchịchị National Resistance Movement ebe ọ meriri Benna Namugwanya, onye bụbu Minista Steeti na-elekọta Kampala Capital City Authority (KCCA).[2] Ọ nọchitere anya mpaghara ahụ na Nzukọ Ndị Omeiwu nke Uganda ruo taa.[3] Ọ na-ejekwa ozi dị ka odeakwụkwọ ukwu na Uganda Women Parliamentary Association, Ọ bụkwa onye nnọchi anya ndị omeiwu nke NRM maka Mubende ka ukwuu.[4]

Ebensidee dezie

  1. 1.0 1.1 KNOW YOUR MP-ELECT: Hope Nakazibwe (en). New Vision. Retrieved on 2022-03-10.
  2. Reporter (2020-09-05). KCCA minister Benna Namugwanya loses Mubende NRM party ticket (en-US). The Independent Uganda. Retrieved on 2022-03-10.
  3. Nakazibwe Hope Grania - 2021 General Election - Visible Polls (en). visiblepolls.org. Retrieved on 2022-03-10.
  4. UWOPA Elects New Executive for the 11th Parliament of Uganda | UWOPA. uwopa.or.ug. Retrieved on 2022-03-10.