Gwen Ramokgopa
Gwen Ramokgopa
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | South Africa |
aha enyere | Gwendoline |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee |
ọrụ ọ na-arụ | Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị |
onye were ọrụ | Tshwane University of Technology |
Dr. Gwendoline "Gwen" Malegwale Ramokgopa bụ onye bụbu MEC maka ahụike na Gauteng, South Africa.
Ọ nọchiri Qedani Mahlangu ma Nomathemba Mokgethi nọchiri ya. Ọ bụ onye isi obodo nke City of Tshwane Metropolitan Municipality site n'afọ 2006 ruo afọ 2010 ma tupu nke ahụ jere ozi dị ka MEC maka ahụike na Gauteng site n'afọ 1998 rụọ afọ 2006. Mgbe ọ gachara dịka onye isi obodo Tshwane, ọ bụ osote minista ahụike na Gọọmentị South Africa site n'ọnwa Nọvemba 2010 ruo n'ọnwa Mee 2014.
Dr. Ramokgopa bụ chancellor nke Tshwane University of Technology. Ọ rụkwara ọrụ dị ka Onye isi oche nke kọmitii na-ahụ maka ndị isi nke Pretoria City Council n'afọ 1995. A mụrụ ya na Atteridgeville ma mechaa nzere MBChB ya na MEDUNSA n'ebe ugwu Pretoria.