Godwin Emefiele
Godwin Emefiele CFR (bụ onye amụrụ ka ọnwa Ọgọstụ dị na mkpụrụ ụbọchị anọ n'afọ 1961) bụ onye Naijiria na adọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị , onye na-ahụ maka akụ na ụba na onye na-arụ n'ụlọ akụ Ọ rụkwara ọrụ dị ka gọvanọ nke Central Bank of Nigeria site n'ụbọchị anọ n'afọ 2014 ruo mgbe Onye isi ala Bola Tinubu chụrụ n'ọrụ n'ụbọchị itoolu n'ọnwa Juun n'afọ 2023.[1][2][3][4]
ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
aha enyere | Godwin |
ụbọchị ọmụmụ ya | 4 Ọgọọst 1961 |
Ebe ọmụmụ | Agbor |
ọrụ ọ na-arụ | onye ọrụ ụlọ akụ |
Ọkwá o ji | Governor of the Central Bank of Nigeria |
ebe agụmakwụkwọ | University of Nigeria |
so na | FII 5th Edition in Riyadh, World Economic Forum Annual Meeting 2023 |
Mbido ndụ ya na agụmakwụkwọ ya
dezieA mụrụ Godwin Emefiele na Lagos State, Naijiria ka ọnwa Ọgọstụ dị na mkpụrụ ụbọchị anọ n'afọ 1961. Ọ bụ nwa afọ Agbor, Delta State, Naijiria. Ọ gara akwụkwọ n'ụlọ akwụkwọ nta nke a nakpọ Ansarudin Primary School na Maryland Comprehensive Secondary ndị dị na Legọsụ, tupu ọ gaa na Mahadum Naịjirịa dị na Nsukka (UNN) maka agụmakwụkwọ ya. O nwetara nzere bachelọ na Banking na Finance, ma gụchaa dịka otu n'ime ụmụ akwụkwọ kachasị elu na klas ya, n'afọ 1984 Ozugbo Ọ jisiri otu afọ dechara ala. Nna ya na National Youth Service, Ọ laghachiri na UNN maka nzere masta na Finance, nke ọ nwetara na 1986. Ọ bụkwa onye gụsịrị akwụkwọ na Mahadum Stanford, Mahadum Harvard (2004) na Wharton School of Business (2005). E nyere ya nzere Doctorate Honorary na Business Administration site na Mahadum Naịjirịa, Nsukka (UNN).[5]
- ↑ Erezi, Dennis. "CBN governor Emefiele joins presidential race, obtains APC form", The Guardian, 6 Mee 2022. Retrieved on 26 Jul 2023.
- ↑ APC ward chairman confirms Emefiele's membership, says CBN gov registered Feb 2021 (en-US). Punch Newspapers (9 May 2022). Retrieved on 24 February 2023.
- ↑ Profile of Godwin Emefiele, new CBN GOV. Vanguard Nigeria (20 February 2014).
- ↑ Reporters (2023-06-10). Tinubu suspends Emefiele, orders CBN probe (en-US). Punch Newspapers. Retrieved on 2023-06-10.
- ↑ Reporter (17 May 2019). UNN Confers Honorary Degree On Emefiele (en-US). Leadership Newspaper. Retrieved on 7 September 2019.