Gerard Moerdijk
ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | South Africa |
aha enyere | Gerard |
ụbọchị ọmụmụ ya | 4 Maachị 1890 |
Ebe ọmụmụ | Modimolle |
Ụbọchị ọnwụ ya | 29 Maachị 1958 |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee |
ọrụ ọ na-arụ | onye na-ese ụkpụrụ ụlọ |
ebe agụmakwụkwọ | Pretoria Boys High School |
omenkà faịlụ na | Frick Art Research Library |
Gerard Leendert Pieter Moerdijk (ugbo Zwaershoek dị nso na Nylstroom, Transvaal, ubochí ànó n'ọnwa Machị 1890 意 Nylstrome rụo ụbọchị iri abụo na itoolu n'ọnwa Machị 1958), nke a makwaara dị ka Gerard Moerdyk, bụ onye[1] South Africa na-ese ụkpụrụ ụlọ nke a maara nke ọma màkà ịmepụta ihe ncheta Voortrekker na Pretoria.
Mbido ndụ, agụmakwụkwọ na ọrụ
dezieNné na nnà Moerdyk bụ ndị Dutch kwagara South Africa na 1888.
N'oge Agha nke Abụọ nke Boer (1899-1902) Gerard Moerdyk (ónyé dị afọ irí n'oge ahụ) nọ n'ogige ịta ahụhụ Standerton ya na nné ya, ụmụnne nwoke abụọ na ụmụnne nwanyị abụọ. Mgbè agha ahụ gasịrị, ezinụlọ ahụ biri na Pretoria ebe Gerard gara ónyé bu ụzọ na Pretoria Boys High School. Ọ gụrụ akwụkwọ na nsọpụrụ na 1909 wee rụọ eru dị ka onye na-ese ụkpụrụ ụlọ na Architectural Association na England. Ọ gụrụ akwụkwọ na France rụọ oge ụfọdụ ma hụ ụlọ Roman na Renaissance na Ịtali.
Moerdyk bụ ónyé South Africa mbụ ịbụ ónyé mmekọ nke Royal Institute of British Architects.
Ihe Ncheta Voortrekker
dezieA na-ewere ihe ncheta Voortrekker na Proclamation Hill na mpụga ndịda Pretoria dị ka ọrụ nka Moerdyk. Ọ bụ ónyé Freemason nke South Africa.[2][3]
Ihe Nketa
dezieE mere ma wuo Dutch Reformed Church na Piet Retief na 1921.
A na-akpọ ụlọ oriri na ọṅụṅụ a ma ama nke ndị Africa na mpaghara Pretoria Arcadia Gerard Moerdyk Restaurant, n'aha ya.
Hụkwa
dezie- Ihe nnọchianya nke oghere na ihe ncheta Voortrekker
Edensibia
dezie- ↑ Maxwell Leigh (1986). Touring in Southern Africa, First, C. Struik Publishers.
- ↑ Swanepoel, F. Verslag oor teenwoordigheid van okkultiese simbole in ons volksmonumente. Volksvergadering Majuba 5-7 Oktober 2012. volksvergadering. Retrieved on 6 October 2018.
- ↑ Geestelike erfenis van die afrikaner in Suid Afrika. Ignited in christ (March 2016). Archived from the original on 22 August 2018. Retrieved on 6 October 2018.