Gerald Mbamalu
Gerald Mbamalu Audio bụ onye ọchịchị ọdịnala nke Ojoto na ọkpụrụ ọchịchị ịme obodo Idemili-South nke Anambra Steetị, ndịda ọwụwa anyanwụ Nigeria.[1]
Ọ bụ nwa nke anọ nke nne na nna ya, Aloysius na Philomina Mbamalu.[2] E kpunyere Gerald Mbamalu okpueze na Eprel 1, 2018 dị ka Eze Ojoto nke Atọ na Ezeanyelu nke Mbụ site n'aka ndị na-eme eze nke obodo ahụ tịnye kwara ndị Igwe-in-Council ya.[3] Ọ nọchiri Igwe Augustine Obidiwe (Eze Ojoto II) onye nwụrụ n'afọ 2017.[4]
E nyere asambodo nkwado nke gọọmentị dịka Iwu Ndị Ọchịchị Ọdịnala nke 1981 si dị site n'aka Gọvanọ Anambra Steeti n'oge ahụ bụ Willie Obiano na Febụwarị 20, 2018.[2] E dekọrọ Ofalla mbụ ya na Jenụwarị 2, 2021 kemgbe okpueze ya na emume ịwa jị ohụrụ na Ọgọst 5, 2021.[5][6][7][8]
Ndị eze ojoto gara aga
dezieE chiri Igwe Abel E. Adirika eze dị ka Ezebube I nke Ojoto (narị afọ nke iri na itoolu)
HRH Igwe Augustine Obidiwe bụ onye e chiri igwe dị ka Azeakajiofoana
E chịrị Igwe Gerald Mbamalu igwe dịka Eze Ojoto nke Atọ na Ezeoranyelu nke Mbụ (2018 ugbu a).[3]
Hụkwa
dezie- Obi nke Onitsha
- Oba nke Benin
- Olofin Adimula Oodua
- Igwe Kenneth Onyeneke Orizu nke Atọ
Edensibịa
dezie- ↑ Sun News. "Eze Ojoto III celebrates Ofala Festival", The Sun, 19 March 2021. Retrieved on 29 May 2022.
- ↑ 2.0 2.1 Gloria. "Ojoto Community Coronates New Monarch", Independent, 2 April 2018. Retrieved on 14 June 2022.
- ↑ 3.0 3.1 Anaeze. "Ojoto Community Coronates New Monarch", Independent Newspaper, 2018.
- ↑ Gloria. "Ojoto Community Coronates New Monarch", Independent, 2 April 2018. Retrieved on 6 June 2022.
- ↑ Rapheal. "Eze Ojoto III celebrates Ofala Festival", Sun New Online, 19 March 2021. Retrieved on 15 June 2022.
- ↑ David. "Traditional ruler of Ojoto, Igwe Mbamalu celebrates first Ofala festival with pomp", Apex News Exclusive, 2021.
- ↑ Osadebe. "Ojoto Community Celebrates New Yam Festival", Anambra Broadcasting Service, 2020.
- ↑ Uzor. "Ojoto goes agog with Ufiejioku festival", Orient Daily News, 14 August 2017. Retrieved on 15 June 2022.