Genny Uzoma
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ebe ọmụmụNaijiria Dezie
Ọrụ ọ na-arụomee Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2005 Dezie

Ụlọ akwụkwọ ọ gara - Enugu State University, Nigeria

Genny Uzoma

Akaọrụ - Onye na-eme ihe nkiri

Afọ n'ọrụ - 2005-ugbu a

Genny Uzoma bụ nwaafọ Naijiria amụrụ ma zulite na steeti Enugu mana o si na Imo steeti . [1] [2]

Mmalite Ndụ na Mmụta dezie

Uzoma bụ onye Imo State, nke bụ ala ebe ndị igbo bi na mba Naijiria na West Afrika. Ọ gụrụ akwụkwọ na Enugu State University of Science and Technology(ESUT), ebe o nwetara akara mmụta ya na Political science.[3]

Ọrụ dezie

Uzoma bidoro ọrụ ime ihe nkiri mgbe ọ dị afọ iri na asatọ.[4] [5] ma e debara aha ya n'okpuru Actors Guild of Nigeria, isi nke Enugu mana ọ hapụrụ ime ihe nkiri nwa oge dika o nwetara ọrụ na ụlọ ọrụ nkwụkọrịta. Ọ mechara hapụ ọrụ ahụ [6] wee laghachi n'ime ihe nkiri. O kwuru banyere mmalite ndụ ya, na-ekwu na ya gbaziri ego iji wee debanye aha ya dịka ezi onye na-eme ihe nkiri ebe ọ bụ na nne na nna ya anaghi akwado [7] mkpebi ya ịbụ onye na-eme egwuregwu. Ọ maara na ọ gaghi enwe isi ijụ ha ego iji kwado ebumnuche ya. [8]

Onyinye na Nhọpụta dezie

  • Uzoma ritere onyinye "Revelation of the year" na Best of Nollywood Awards (BON), n'afọ 2015. [9]
  • A họpụtara ya maka onyinye City People Movie award dịka Most promising actress of the year (English) n'afọ 2018.

Ndụ ya dezie

Uzoma kwuru n'ihe omumu ntụrụndụ ya na mmasị ya metụtara nkà na akwụkwọ. [10]

Ihe Nkiri A họpụtara dezie

  • I wish She Would
  • The Shopgirl
  • Birthday Bash
  • Husbands of Lagos[11]
  • The Vendor
  • Our Society
  • Best of the Game
  • Classical Fraud
  • Royal Doom
  • Eagles Bride
  • Who killed Chief
  • A Love story
  • Emem and Angie
  • Reconciliation
  • The Gateman
  • Baby Shower
  • Baby mama
  • Commitment Shy
  • Scream
  • A face in the Crowd
  • Caught in between
  • King of Kings
  • Love in the wrong places
  • The washerman
  • Once upon an adventure
  • Bond (2019)

Ebe m si dee dezie

Njikọ dị na mpụga dezie

  • Genny Uzoma on IMDb