Febụwarị 2010 Bọmbụ Karachi

Bọmbụ nke Febụwarị 2010 na Karachi bụ usoro bọmbụ abụọ na Karachi na Pakistan na 5 Febụwarụ 2010. Ọ dịkarịa ala mmadụ iri abụọ na ise nwụrụ ma merụọ ihe karịrị mmadụ iri ise ahụ. mwakpo nke metutara ndi Shia Muslims mere na Arba'een, o bu ihe ekpemekpe ana eme n'abali 40 obula ma emecha ubochi nke Asura

Mwakpo

dezie

Bọmbụ mbụ ahụ mere mgbe onye gburu onwe ya na ọgba tum tum bu bọmbụ kụrụ bọs bu ndị njem ala nsọ Shia. Mmadụ iri na abụọ nwụrụ. Ndị na-ekpochapụ bọmbụ kwuru na onye na-agba ịnyịnya ígwè ahụ na-eyi jaket igbu onwe ya nke nwere 15-20kg nke bọmbụ. Mgbe ihe dị ka otu awa gachara, mgbawa ọzọ mere n'èzí ụlọ ọgwụ mberede nke Ụlọ ọgwụ Jinnah ebe a na-elekọta ọtụtụ ndị merụrụ ahụ site na mgbawa mbụ. Ọ dịkarịa ala mmadụ iri nwụrụ na mgbawa a.