Fatou Pouye
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ọkpụkpọ basketball Dezie

Fatou Pouye (amụrụ ya na onwa Jenụwarị 14, n’afo1997) bụ onye Senegal na-atu bọọlụ nke na-agba maka Klọb Joventut Badalona .

Ọrụ ịgba agba dezie

Fatou mgbe ọ nọ n'ụlọ akwụkwọ sekọndrị turu bọọlụ otu oge na Glasgow Christian Academy, nke di na Kentucky na SEED Academy, Thiès . [1]

Dịka onye ọhụrụ na South Georgia Technical College (2017-2018) ọ na-egwuri egwu na otu ahụ wee bụrụ onye otu NJCAA Region XVII Championship team.[2] Ọ pụtara n'egwuregwu iri ato na abuo dịka nwa akwụkwọ nke abụọ na South Georgia Technical College (JUCO) , ọ ghọrọ onye Georgia Collegiate Athletic Association (GCAA) Division I women's basketball Player of the Week ugboro atọ na, onye egwuregwu basketball ụmụ nwanyị mbụ a họpụtara dịka Player of the week na Division I nke afo 2019. [3]

Tupu ọ gaa Mahadum Duquesne, Fatou na Western Kentucky Lady Toppers turu bọọlụ ọ bụla dịka onye nche. Dịka onye na-eto eto, o nwetara akara okpukpu abụọ ma kpọọ ya aha maka Conference USA Commissioner's Honour Roll ma nweta Dean's List na semester nke oge opupu ihe ubi. Dịkwa ka onye okenye, Fatou nwere okpukpu abụọ atọ, nwetara akara iri abuo na otu n'oge egwuregwu megide Louisiana Tech ma wepụ rebounds iri na ato megide ha, ọ bụ onye na-ebute akara maka otu ahụ na egwuregwu anọ ma chịkọta rebounds iri na ano dị elu na Rice na onwa Febụwarị 12 na 23 na FIU na Febụwarị 26.[4]

Fatou sonyeere Duquesne Dukes dịka onye gụsịrị akwụkwọ na afo 2021 wee gbaa egwuregw u iri abuo Na asato , bụrụ onye nke abụọ na otu ahụ na nke iri na asatọ na nzukọ ahụ.

Na onwa Septemba n’afo 2023, Fatou sonyeere Club Joventut Badalona, otu klọb basketball nke obodo Spain. Ọ tukwara ndị otu Senegal bọọlụ maka FIBA Women's AfroBasketball na afo 2024, maka FIBA women's Olympic Qualifying Tournament Belgium . [5]

Edensibia dezie

  1. 2021-22 Women's Basketball Roster.
  2. Fatou Pouye - Women's Basketball (en). Duquesne University Athletics. Retrieved on 2024-03-25.
  3. Bird (2019-01-09). SGTC Lady Jets Fatou Pouye named GCAA Division I Player of Week (en). SGTC. Retrieved on 2024-03-25.
  4. Fatou Pouye - Women's Basketball (en). Duquesne University Athletics. Retrieved on 2024-03-28.
  5. Fatou Pouye - Player Profile (en). FIBA.basketball. Retrieved on 2024-03-28.