Farhiyo Farah Ibrahim
Farhiyo Farah Ibrahim (Somali: Farxiyo Faarax Ibraahim, Arabic: العبارة فرح إبراهيم) bụ onye na-ahụ maka mmekọrịta mmadụ na ibe ya na onye ntụgharị okwu. Ọ bụ onye na-akwado ikike ụmụ nwanyị na ahụike ọmụmụ.
Farhiyo Farah Ibrahim العبارة فرح إبراهيم | |
---|---|
Born | Templeeti:Birth based on age as of date |
Occupation | activist, interpreter |
Ndụ onwe onye
dezieA mụrụ Ibrahim n'etiti afọ 1982 na 1983 na Somalia. N'oge agha obodo nke malitere na mbido afọ 1990, ndị agha ji égbè gburu nna nna ya ma wakpo nne ya. O mechara kwaga Kenya na 1992, na-ebi na ogige ndị gbara ọsọ ndụ UNCHR na Dadaab . [1]
Mgbe ọ gụsịrị klas nke asatọ, Ibrahim hapụrụ ụlọ akwụkwọ iji kwado ndị ikwu ya. O mechara kewapụ onwe ya n'ezinụlọ ya mgbe ọ jụrụ ịlụ nwoke tọrọ ya.[1]
Ọrụ
dezieN'afọ 2002, Ibrahim rụrụ ọrụ dị ka onye na-akpali ahụike ọmụmụ maka National Council of Churches na Kenya. N'ime ya, ọ kwalitere ndụmọdụ na nyocha nke afọ ofufo maka HIV / AIDS yana iji mgbochi afọ ime, ma mee mkpọsa megide igbupụ akụkụ ahụ nwanyị. Ụdị ọrụ ndụmọdụ ya bụ isi iyi nke esemokwu n'etiti ezinụlọ ya na ndị obodo Somalia ka ukwuu, ndị chere na ọ bụghị ihe na-ekwekọ na nzụlite ya. N'ihi nrụgide, Ibrahim mechara kwụsị ọrụ ya na NCCK.[1]
Dika nke 2008 Ibrahim na eje ozi dika onye ntughari okwu.[1][2] Ọ na-akwadokwa ikike ụmụ nwanyị na ụmụ agbọghọ.
Ihe nrite
dezieN'afọ 2008, e nyere Ibrahim International Women of Courage Award maka ọrụ nkwado ya. [2]
Ntụaka
dezie- "Farhiyo Farah Ibrahim meriri nturu ugo umunwanyi ihe nrite steeti". U.S. Department of State. Eweputara 12 septemba 2014.
- "Ụmụ nwanyi nwere obi Ike" Devex. 8 Maachi 2012 .eweputara 12 septemba 2014.
- "Ụbọchị ụmụ nwanyị mba ụwa - ihe nrite ụmụ nwanyị obi ike nke mba ụwa" (PDF). Department of State. Eweputara 23 Eprel 2014.
- ↑ 1.0 1.1 1.2 1.3 Farhiyo Farah Ibrahim wins State Department's Women of Courage Award. U.S. Department of State. Retrieved on 12 September 2014.
- ↑ 2.0 2.1 International Women's Day - International Women of Courage Award Ceremony. Department of State. Retrieved on 23 April 2014.