Fadhili Frank Mtanga (amụrụ na ubochi iri na anọ na onwa Nọvemba na afo otu puku narị itoolu iri asatọ na otu) nke a maara nke ọma site na aha edemede ya bụ Fadhy Mtanga[1] [1] bụ Onye edemede Tanzania, [2] Onye ntụgharị, Onye na-ede blọgụ, onye na'ese foto, onye na -ese ihe osise na onye ọrụ mmekọrịta mmadụ na ibe ya.   [citation needed]

O bipụtara akwụkwọ akụkọ Swahili mbụ ya, Kizungumkuti na 2011, nke Huba [3] sochiri na 2014 na Fungate [4] na 2017. N'afọ puku abụọ na iri abụọ, o bipụtara akwụkwọ akụkọ ya nke anọ bụ Rafu . N'ọnwa Ọgọstụ afọ puku abụọ na iri abuo, Fadhy malitere ihe ọ kpọrọ #TuzoChallenge na mgbidi Facebuku ya. Ọ mara ndị edemede Swahili ndị ọzọ aka ka ha gaa n'ihu na akụkọ ọhụrụ ya nke ọ kpọrọ Tuzo. Dị ka ihe mbụ e mere n'ụwa nke akwụkwọ, ihe ịma aka ahụ dugara na mbipụta nke akwụkwọ akụkọ mbụ nke ụdị ya na-aga n'otu aha ahụ. Ndị edemede ise (Fadhy Mtanga, Lilian Mbaga, Maundu Mwingizi, Laura Pettie na Hussein Tuwa) gosipụtara ya, Tuzo nke a malitere na Disemba 2020.[5]

O biputara akwukwo uri Swahili mbụ ya Hisia [6] n'afọ puku abụọ na iri n asatọ.

O dere ọtụtụ akụkọ mkpirikpi a na-anakọtaghị nke ọ na-ekerịta mgbe niile site na blọọgụ ya na akaụntụ netwọk mmekọrịta. A sụgharịrị ụfọdụ n'ime akụkọ mkpirikpi ya n'asụsụ Bekee ma gosipụta na nchịkọta akwụkwọ ntule ùgwù ọdịda anyanwụ na Amerika na Oregon. A sụgharịrị Haiba n'asụsụ Bekee dị ka Attitudes ma gosipụta nchịkọta akụkọ dị mkpirikpi nke owuwa anyanwu Afrika, No Edges, nke ụlọ obibi akwụkwọ Amerika, bipụtara.

Akụkọ ya, nke na-egosi ndị mmadụ si n'ụdị ndụ dị iche iche na klas mmekọrịta mmadụ na ibe ya, na-atụgharị uche ma na-ejikọta okwu mmekọrịta, okwu ezinụlọ, na ihe ndị metụtara ọrụ, ike, na ikike. Site n'iji ahịrịokwu staccato, iwebata okwu ọhụrụ, na itinye okwu na ahịrịokwu Bekee n'ụzọ aghụghọ, ihe odide Fadhy Mtanga enyewo aka dị ukwuu na mmepe nke Swahili nke oge a.[7]

Ewezuga ide ihe, Fadhy na-arụ ọrụ dị ka onye isi nchịkwa nke otu NGO nke Tanzania, Health & Insurance Management Services Organization (HIMSO) nke dị na Mbeya.[8]

Ọrụ dezie

  • Kizungumkuti (2011)
  • Huba[9][10] (2014)
  • Fungate (2017) [11]
  • Hisia (2018)
  • Rafu (2020)
  • Tuzo (2020) na ndị edemede Swahili anọ ndị ọzọ

Ebe mụ si dee dezie

  1. Mtanga (22 October 2020). Fadhy Mtanga. Retrieved on 9 February 2021.
  2. Fadhy Mtanga – poems -. dokumen.tips. Retrieved on 20 December 2018.
  3. Huba. Huba. mwalimuwakiswahili.com.
  4. Fungate. "Press Reader", 26 May 2017. Retrieved on 20 December 2018.
  5. Mngodo. "Tanzanian writers fighting sextortion through a novel", The Citizen, 16 February 2021. Retrieved on 5 July 2021.
  6. Mtanga (30 May 2018). Ninawaleteeni kitabu cha HISIA. Fadhy Mtanga. Retrieved on 20 December 2018.
  7. No Edges | Center for the Art of Translation | Two Lines Press. Two Lines Press. Retrieved on 25 April 2024.
  8. Mr. Fadhili Mtanga | HIMSO - Health Information Management Services Organization. HIMSO. Retrieved on 25 April 2024.
  9. Mtanga (2014). Huba (in sw). Jukwaa Huru Media. 
  10. Princeton University Library. Princeton University Library. Retrieved on 20 December 2018.
  11. Mtanga (2017). Fungate (in sw). UWARIDI. ISBN 9789987950843. 

 Nchịkọta ikike