Fabian Udekwu
Fabian Anene Ositadimma Udekwu Audio (n'afo 1928 na ubọchi nke irina asaa nke onwa Nọvemba n'afo 2006) onye amụrụ na Enugwu Agidi, Anambra Steeti bụ kwa dọkịta na-ahụ maka ahụike, onye na-awa ahụ n'obi. Ọ bụ prọfesọ pụrụ iche nke ịwa ahụ n'obi na Mahadum nsukka nke Naijiria, na onye ọsụ ụzọ nke ịwa obi na-emeghe n'Africa.[1]
Agụmakwụkwọ
deziePrọfesọ Udekwu gara St. Charles koleji nzulite ndi nkuzi na Onitsha ebe e debere ya dị ka onye otu ngalaba mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ n'afo1947, na-akụzi mgbakọ na mwepụ na ọdịdị ala.[2] O mere ule matrikuleshon London ya site na akwụkwọ ozi ma mgbe o tukobarara ego zuru ezu ọ gara n'ihu n'afo 1950 na United States maka ọmụmụ ihe ọzọ. O mere ọmụmụ ọgwụ ya na Bayooji, Kemistri na Fizis na Los Angeles.[3] N'ikpeazụ, ọ gara mahadum Loyola nke Chicago Stritch ụlọakwụkwọ ọgwu,ọ gụsịrị akwụkwọ dị ka dọkịta n'afo 1957 ma bụrụ ọkachamara na ịwa ahụ obi na obi n'ozuzu ya n'afo1964.[4][5] O mere ọzụzụ ịwa ahụ ya na ulọ ọgwu Cook County di na Chicago.[3] Fabian Udekwu bụ dọkịta mbụ na-awa ahụ obi na obi na Naịjirịa.[6] Ọ bụ onye otu Koleji Ndị dọkịta na-awa ahụ na Amerika, njiko ndi dokinta na-awa ahu obi na Amerika, koleji mba uwa nke ndi na-awa afọ na Koleji ọdịda anyanwụ African nke ndị na-awa afo.[7] Udekwu bụ onye guzobere na onye otu ulo akwukwo Naijiria nke sayensi.[8]
Ọrụ
dezieUdekwu laghachiri Naịjirịa n'afọ 1965 dị ka dọkịta na-ahụ maka obi na obi na Mahadum College ụlọ ọgwu nke Mahadum Ibadan.[6] Ọ hapụrụ Ibadan gaa Enugu mgbe mmekpa ahu malitere nke gosipụtara mmalite nke agha obodo Naịjirịa.[9] Ọ rụrụ ọrụ dị ka onye dọkịta na-awa ahụ ndị agha na onye isi ụlọ ọgwụ nkuzi Biafran n'ebe dị iche iche gụnyere Enugu na Emekukwu n'oge agha ahụ.[10] Ọ bụkwa odeakwụkwọ nke njikọ enyemaka na nhazigharị ndi Biafra n'oge agha ahụ.[11] Udekwu mechara bụrụ Prọfesọ Pụrụ Iche na Onye isi nke Ngalaba Ịwa Ahụ nke Ụlọ Ọgwụ Nkuzi Mahadum Naịjirịa,(UNTH) ma bụrụ onye isi nchịkwa nke Enugu Campus nke Mahadụ ahụ.[3] A na-eto Prọfesọ Udekwu maka iwulite Ngalaba Ịwa Ahụ nke Mahadum Naịjirịa.[3] N'agbanyeghị ọtụtụ mgbalị na-enweghị isi iji nweta ego iji guzobe ngalaba ịwa ahụ nke oge a site n'ọtụtụ òtù na United Statei, United Kindom, Scandinevia ma site na enyemaka ụka, o nwere ike inweta ego site na ogige Enugu site ya na onyinye nke ndị Naijiria ọ bụla iji wuo ụlọ ịwa ahụ ma zụta ngwá ọrụ dị mkpa iji guzopụta ụlọ ọrụ maka ịwa ahụ n'obi na Naijiria.[3] Ọ bụ otu n'ime ndị ọsụ ụzọ guzobere ịwa ahụ obi na Naịjirịa.[12] Prọfesọ Udekwu duziri otu ndị dọkịta na-awa ahụ nke mere ịwa ahụ obi mbụ gara nke ọma na Naịjirịa n'afo 1974 nke bụ nke mbụ n'ụdị ya na Africa ojii.[13][3] Ọzọkwa n'ime ndị otu ndị dọkịta na-awa ahụ na-arụ ọrụ a dị ịrịba ama bụ Prọfesọ Sir Magdi Yacoub, Prọfesor Anyanwu C.H., Nwafor D.C., onye na-akụnwụ ahụ Dr. Shreeniwas Jawalekar na ndị ọzọ.[14][15] Usoro ịwa ahụ obi isii ọzọ sochiri nkea n'okpuru Udekwu na Mahadum ulo ọgwu nkuzi Naịjirịa (UNTH) n'etiti afọ 1974 na 1980.[16]
Ndụ onwe onye
dezieUdekwu bụ onye na-eme egwuregwu nke ukwuu, na-egwu bọọlụ na tennis n'oge ndụ ya niile. Ọ bụ onye otu Enugu Sports klọb. Ọ na-akpọkwa egwu dị ka ihe ntụrụndụ na-enweta aha dị ka onye na-akpọ ụbọ akwara na onye na-eduzi ukwe na Holy Ghost katidral di n'Enugu. Na ubochi nke iri abuọ na asaa nke onwa Eprel na'afo1956 Udekwu lụrụ nwada Anna Brita Bystrom. E jiri ụmụ iri gozie alụm di na nwunye ahụ.[17]
Akwụkwọ ndị e bipụtara
dezie- Ezumike ahụike na Naịjirịa.[18]
- Pseudocyst pancreatic n'ime ụmụaka[19]
- Aspergilloma akpa ume: akụkọ nke ọrịa abụọ sitere na Naịjirịa.[20]
- Nkọwapụta nke mmiri zuru ezu nke ahụ na tritium oxide, FAO Udekwu, PD Kozoll, KA Meyer ̊ Jonal nke nuclear Medicine, 1963
- Aneurysm nke akwara akpa ume aka ekpe na hemoptysis na ihe nnochi ụzọ bronchial.[21]
- Ahụmahụ mbụ na ịwa ahụ obi na Naịjirịa, Anyanwu CH, Ihenacho HNC, Okoroma EO, Nwafo DC, Umeh BU, Okechukwu CC, Udekwu FA. Cardiologie Tropicale, Tropical Cardiology 1982;8:1237
- Nnyocha nke alveolar soft tissue sarcoma.[22]
- Renal angiomyolipoma. Nnyocha ahụike na nke ọrịa.[23]
- Traumatic aneurysms na arteriovenous fistulas na Naịjirịa.[24]
- Akụkụ ahụike nke carcinoma akpa ume na pleural na Naịjirịa.[25]
- Teratoma nke gland thyroid.[26]
- Black grain mycetoma n'ihi Madurella mycetomi: akụkọ ikpe sitere na East Central State nke Nigeria.[27]
- Ịrịgo aneurysm aortic na-akpata stenosis nke akpa ume.[28]
- Odeku (1970). "Persistent ascites following infected ventriculoperitoneal shunt". West African Medical Journal 19: 72–73. [29]
Ihe edeturu
dezie- ↑ Ojigbo (2019-10-08). Fabian Udekwu :- Pioneer of open heart surgery in sub-Saharan Africa (en-GB). Pharmanewsonline. Retrieved on 2020-05-25.
- ↑ Jacob Ukeje Agwu ( 1925–2008 ) A Brief History of His Life, biographical article, Nigeriamasterweb, retrieved 27 June 2013
- ↑ 3.0 3.1 3.2 3.3 3.4 3.5 White (25 July 1974). A professor's dilema, 63 number 907, New Scientist. Retrieved on 18 November 2014.
- ↑ Udekwu, Fabian MD, Thoracic Surgery Maywood , IL, Doximity website, retrieved 27 June 2013
- ↑ Udekwu, Fabian A.O. ,medicineonline retrieved 27 June 2013
- ↑ 6.0 6.1 Adebonojo. DEVELOPMENT OF OPEN HEART SURGERY IN WEST AFRICA: A HISTORICAL PERSPECTIVE. Archived from the original on 21 January 2016. Retrieved on 2 December 2015.
- ↑ List of Fellows, West African College of Surgeons, Number 122, retrieved 27 June 2013
- ↑ List of fellows. Nigerian Academy of Science. Archived from the original on 9 November 2015. Retrieved on 5 December 2015.
- ↑ Adler (2015). After the Tall Timber: Collected Nonfiction. New York Review of Books, 230–233. ISBN 978-1590178805.
- ↑ BIAFRA / KRIEGSOPFER; Verlorene Unschuld, Der Spiegel (German), published 8 December 1969, retrieved 27 June 2013
- ↑ News article on Biafra, The Saturday Review, 3 May 1969, p. 21, retrieved 28 June 2013
- ↑ SURGERY IN NIGERIA: The Will and The Way, FACULTY LECTURE DELIVERED TO FACULTY OF SURGERY NATIONAL POSTGRADUATE MEDICAL COLLEGE ON 16 September 1988 By Professor E. A. Elebute
- ↑ Eze (2007). "Open-Heart Surgery in Nigeria Indications and Challenges". Tex. Heart Inst. J. 34 (1): 8–10. PMID 17420786.
- ↑ Shreeniwas Jawalekar, Open Drops To Open Hearts!: Journey of an Anesthesiologist from India to America (memoir), Published 8 April 2010 by Outskirts Press, pp.61–64
- ↑ J Nwiloh, S Edaigbini, S Danbauchi, I Babaniyi, M Aminu, Y Adamu, A Oyati, Cardiac surgical experience in northern Nigeria Cardiovascular Journal of Africa • Vol 23, No 8, September 2012
- ↑ S.O. Michael, Chronicles of Medical History in Africa; Pioneers of Heart Surgery from Aristotle to Grillo, Annals of Ibadan Postgraduate Medicine Vol. 7 No.2 December 2009
- ↑ Science & Medicine; Nigerian Achievers in Medicine. The Achebe Colloquium (17 July 2006). Archived from the original on 12 May 2023. Retrieved on 12 May 2023.
- ↑ Udekwu (14 August 1965). "A Medical Holiday in Nigeria.". Canadian Medical Association Journal 93 (7): 328. PMID 20328321.
- ↑ UDEKWU (August 1965). "Pancreatic Pseudocyst in Children". The Journal of the International College of Surgeons 44: 123–7. PMID 14310292.
- ↑ Anyanwu (August 1982). "Pulmonary aspergilloma: report of two cases from Nigeria.". The Journal of Tropical Medicine and Hygiene 85 (4): 143–7. PMID 7143529.
- ↑ Udekwu (November 1965). "Aneurysm of the left pulmonary artery with hemoptysis and bronchial obstruction.". The Journal of Thoracic and Cardiovascular Surgery 50 (5): 753–6. DOI:10.1016/s0022-5223(19)33164-2. PMID 5845460.
- ↑ Udekwu (December 1965). "Studies of an alveolar soft tissue sarcoma.". British Journal of Cancer 19 (4): 744–8. DOI:10.1038/bjc.1965.86. PMID 4285917.
- ↑ Udekwu (September 1966). "Renal angiomyolipoma. Clinical and pathological study.". International Surgery 46 (3): 205–14. PMID 5916848.
- ↑ Anyanwu (August 1980). "Traumatic aneurysms and arteriovenous fistulas in Nigeria.". The Thoracic and Cardiovascular Surgeon 28 (4): 265–8. DOI:10.1055/s-2007-1022092. PMID 6158130.
- ↑ Anyanwu (1979). "Clinical aspects of pulmonary and pleural carcinoma in Nigeria.". Medical Journal of Zambia 14 (5): 83–9. PMID 7053009.
- ↑ Suseelan (1976). "Teratoma of the thyroid gland". International Surgery 62 (11–12): 586–7. PMID 591232.
- ↑ Gugnanni (1976). "Black grain mycetoma due to Madurella mycetomi: a case report from the East Central State of Nigeria.". Nigerian Medical Journal 6 (4).
- ↑ Anyanwu (September 1979). "Ascending aortic aneurysm causing pulmonary stenosis.". East African Medical Journal 56 (9): 457–60. PMID 520267.
- ↑ Shehu (2006-04-12). "Acute ileus following ventriculoperitoneal shunt: case report". East African Medical Journal 82 (9): 486–7. DOI:10.4314/eamj.v82i9.9342. ISSN 0012-835X. PMID 16619725.