Esther Banda
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Zambia |
aha enyere | Esther |
ụbọchị ọmụmụ ya | 4 Novemba 1958 |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee |
ọrụ ọ na-arụ | Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị |
Ọkwá o ji | Member of the National Assembly of Zambia |
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị | Patriotic Front |
Esther Mwila Banda (amụrụ na 4 Nọvemba na afo 1958) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Zambia. Ọ rụrụ ọrụ dị ka onye otu National Assembly maka Chililabombwe site na 2006 ruo 2016, ọ bụkwa osote minista n'etiti afọ 2011 na afo 2016.
Akụkọ ndụ ya
dezieBanda gụrụ maka BA na sociology ma rụọ ọrụ dị ka onye na-ahụ maka mmekọrịta mmadụ na ibe ya.[1] O sonyere na ntuli aka nke afọ 2001 dị ka onye otu United Party for National Development na Chililabombwe, mana ọ bụ onye nke abụọ na onye otu Movement for Multi-Party Democracy Wamundila Muliokela.[2] Na ntuli aka na afọ 2006, Banda bụ onye na-azọ ọkwa Patriotic Front ma merie Muliokela (onye bụ Minista na-ahụ maka nchekwa n'oge ahụ), na-aghọ onye omeiwu nke mpaghara ahụ.[2] A họpụtara ya ọzọ na afo 2011, mgbe nke ahụ gasịrị, a họpụtara ya ka ọ bụrụ osote minista nke Gọọmentị Obodo, Ụlọ, Mmụta Mbido na Nchebe Gburugburu Ebe Obibi.[2][3] N'afọ sochirinụ, ọ ghọrọ osote minista na Ministry of Gender and Child Development nke e guzobere ọhụrụ. N'ọnwa Febụwarị na afọ 2015 ọ ghọrọ osote minista na-ahụ maka njem nleta na nka mgbe Edgar Lungu ghọrọ onye isi ala.[4] O jikwa ọkwa onye isi oche ụmụ nwanyị nke mba n'ime Patriotic Front.[5]
Banda agbaghị ọsọ na ntuli aka nke afọ 2016, onye na-azọ ọkwa onye omeiwu nke PF bụ Richard Musukwa nọchiri ya dị ka onye omeiwu Chililabombwe.[6]
Ebesidee
dezie- ↑ Ester Mwila Banda National Assembly of Zambia
- ↑ 2.0 2.1 2.2 Zambia Election Passport
- ↑ List of newly appointed Cabinet and Deputy ministers Lusaka Times, 29 September 2011
- ↑ Lungu maintains almost all deputy ministers Zambia Watchdog, 16 February 2015
- ↑ PF here to stay, says Banda Zambia Daily Nation, 15 February 2016
- ↑ List of PF MPs that won’t be adopted for 2016 Zambia Watchdog, 24 August 2015