Esther Audu

Onye na-eme ihe nkiri Nollywood
Esther Audu
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereEsther Dezie
aha ezinụlọ yaAudu Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya22 Maachị 1982 Dezie
Ebe ọmụmụLagos, Ikeja Dezie
Ọrụ ọ na-arụomee, omee ihe nkiri Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Jos Dezie

Esther Ene Audu (amụrụ na Machị 22, 1986) bụ nwaafọ Naịjirịa onye na- eme ihe nkiri [1] [2] Ọ bụ onye amaara nke ọma site n’ ihe nkiri ndị a Dinner (2016), Mystified (2017) na Order of the Ring (2013).

Esther Audu
Esther Audu

Mmalite ndụ na mmụta dezie

A mụrụ Esther Audu na abalị iri abụọ na abụọ n'afọ 1986 na Ikeja Lagos n’ime ezi-na-ụlọ Maazị James Audu, onye soja lagoro ezumike nka nke rụrụ ọtụtụ n’ime ọrụ ya na Lagos ma biri na Ikeja Military Cantonment ebe amụrụ Audu na ụmụnne ya ise ndị ọzọ. Audu bụ ọdụ nwa n’ime ụmụ isii ezinụlọ ya bụrụ ndị Olamaboro nke Steeti Kogi, ọ gara ụlọ akwụkwọ praịmarị na Sekọndịrị nke nta ya na Lagos. N'afọ 2002, ezinaụlọ ha hapụrụ Lagos gawa Abuja, n'Abuja ka ọ gụchara akwụkwọ sekọndrị ma mesịa nweta nnabata ịmụ Business Management na Mahadum Jos, Plateau Steeti n'afọ 2006, ọ gụsịrị akwụkwọ nweta BA Business Management na 2010. [2]

Ọrụ dezie

Esther malitere ọrụ ya kemgbe ọ nọ n' ụlọ akwụkwọ sekọndrị; o kwuru na ị bụ onye mgbasa ozi bụ ọchichọ ya. N' ụlọ akwụkwọ sekọndrị o soro n'otu Drama na Literary ebe ọ sonyere na eme ejije. Ka osinadị, na 1996, ọ so na ndị ahọpụtara ịnọchite anya Naịjirịa na kidafest na Ghana, site na ebe ahụ agụụ ya maka ime ihe nkiri malitere itolite ma kwụsịkwa nrọ ya ịbụ onye mgbasa ozi. O buru ụzọ pụta na fim ebe ọ bụ onye ndu aha ha bụ: Ungodly romance na Sins of Rachael na Jos nke Alex Mouth kwuru na ọ bụ ihe nkiri izizi mbụ nke nyeere aka ịmalite ọrụ ya na Nollywood. Agbanyeghị, na Audu ka na-agụ akwụkwọ, o sonyere n' ihe nkiri akpọrọ: Fatal Mistake Norbert Ajagu, dika onye na-esota onye isi.

Ndụ onwe dezie

Esther lụrụ Philip Ojire onye oru ahia n' onye guzobere Shirt freak.

Ihe nkiri dezie

Afọ Ihe nkiri Ọrụ Ihe edeturu
Ungodly Romance
Sins of Rachael
Fatal Mistake
2009 Behind a Smile
2010 Best Interest
2010 Best Interest
2012 Two Hearts
Royal Grace
Judas Game
Bachelors Hearts
2013 Return of The Ring
2016 Dinner
2017 Mistified

Ihe nrita na nhọpụta dezie

Nrụtụaka dezie

  1. "Actress Esther Audu Ojiri Expecting first Child 3 Years After Marriage", Allure Vanguard Nigeria, Vanguard NG, 22 March 2008. Retrieved on 5 May 2020.
  2. 2.0 2.1 Template error: argument title is required.

Njikọ ndị ọzọ dezie

  • Esther Audu on IMDb