Erik Laubscher
ụdịekere | nwoke |
---|---|
aha enyere | Erik |
aha ezinụlọ ya | Laubscher |
ụbọchị ọmụmụ ya | 1927 |
Ebe ọmụmụ | Tulbagh |
Ụbọchị ọnwụ ya | 22 Mee 2013 |
ọrụ ọ na-arụ | onye ese |
ikike nwebiisinka dị ka onye okike | Ọrụ nwebiisinka chekwara |
omenkà faịlụ na | Frick Art Research Library |
Erik Laubscher (afọ 1927, Tulbagh, South Africa rụọ úbọchị irí abụọ na abụọ n'ọnwa Maachị n'afọ 2013) bụ ónyé na-ese ihe nà South Africa.
Ọrụ
dezieA mụrụ Erik Frederik Bester Howard Laubscher na Tulbagh, ọ tolitere na Port Elizabeth. Mgbè o gosipụtara mmasị na nka, ọ malitere ọmụmụ ya na Continental School of Art n'afọ 1946.[1] Laubscher zụrụ n'okpuru Maurice van Essche site n'afọ 1946 na afọ 1947 tupu ọ gaa n'ihu na London na Paris n'okpuru John Minton, Claude Venard na Fernand Léger.[2] E nyere ya Carnegie Study Grant na US n'afọ 1966.[3] Na South Africa, e nyere ya Cape Arts Medal n'afọ 1972, S.A. Akademie vir Wetenskap en Kuns - Besondere Erepenning vir Skilderkuns n'afọ 1990, na The Cape Tercentenary Foundation Award màkà onyinye pụtara ìhè na nka ányá n'afọ 1994. O guzobere Ruth Prowse School of Art na 1970 wee laa ezumike nká dị ka onye isi ya na ngwụcha afọ 1995. Ọ lụrụ onye na-ese ihe Claude Bouscharain onye ọ zutere na Académie Montmartre na 1950.[1] N'afọ 2012 ọ natara ihe nrite Molteno màkà ihe ọ rụzuru na Fine Arts.[4]
Edensibia
dezie- ↑ 1.0 1.1 Erik Laubscher. Strauss&co. Retrieved on 20 June 2020.
- ↑ Laubscher, Erik (Frederik Bester Howard). Absolut Art Gallery. Retrieved on 20 June 2020.
- ↑ Erik Laubscher. SouthAfricanArtists.com. Retrieved on 20 June 2020.
- ↑ CAPE TERCENTENARY FOUNDATION ARCHIVES - AWARDS. Cape 300 Foundation. Retrieved on 20 June 2020.