Emueje Ogbiagbevha

Emueje Ogbiagbevha
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
obodo maka egwuregwuNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya10 Febụwarị 1990 Dezie
Ebe ọmụmụWarri Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye otu egwuregwu bọọlụ Dezie
ọnọdụ egwu na otu / ọpụrụichegaa n'ihu Dezie
ụdị egwuregwuFootbọl Dezie

Emueje Ogbiagbevha bụ onye egwu bọọlụ Naịjirịa na-agbara FC Minsk bọọlụ ugbu a na Premier League nke Belarus . [1] Ọ gaburu bọọlụ na BIIK Kazygurt na Kazakhstani Championship, [2] na Russian Championship mgbe ọ nọ na Rossiyanka na Energiya Voronezh . [3] Ọ bụ onye kachasị nweta akara goolu nke afọ 2010 n'egwuregwu ahụ [4] mgbe ọ na-agbara ndị Rossiyanka bọọlụ, nke o meriri okpukpu abụọ. Ọ gbabuorola ndị otu Energiya Voronezh na Kazygurt bọọlụ na Champions League, ọ bụkwa onye otu ndị otu egwuregwu bọọlụ Naịjirịa. Nkwekorita ya na BIIK Kazygurt bịara na njedebe na ngwụch nke afọ 2012.  N’afọ 2016, Ogbiagbevha banyere otu egwuregwu FC Minsk .

N'oge egwuregwu bọọlụ afọ 2019-2020, ọ ghọọrọ nwanyị Afrịka mbụ nwetara ihe nrite (nkekọrịta) UEFA Women's Champions League topscorer. [5] Mgbe oge ahụ gasịrị, nkwekọrịta ya gwụchara na Minsk. [6]

Ọrụ mmalite dezie

Ọ gbabuola bọọlụ na Pelican Stars FC, Nasarawa Amazons na Delta Queens FC na Nigeria Women Premier League . [7]

Nrụtụaka dezie