Elsie Nwanwuri Thompson
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
aha enyere | Elsie |
ọrụ ọ na-arụ | oka mmuta |
ebe agụmakwụkwọ | Queen Mary University of London |
Elsie Nwanwuri Thompson bụ onye ọka ikpe nke Ụlọikpe Kasị Elu nke Rivers State, Nigeria. A mụrụ ya ma zulite ya na port Harcourt ọ rụrụ ọrụ dị ka osote onye ịsị ala na onye isi ala maka International Federation of Women Lawyers Nigeria. Ọ bụkwa onye enyemaka na nzukọ ọmụmụ ihe na nzukọ. [nkọwa dị mkpa] Na 27 Julaị 2010, ọ ghọrọ onye Naijiria mbụ a họpụtara na Ụlọikpe Africa na-ahụ maka ikike mmadụ na ndị mmadụ maka afọ isii. Ọ bụ osota onye isi oche nke ụlọ ikpe site na 2014 ruo 2016.[1]
Agụmakwụkwọ na ọrụ
dezieThompson nwetara nzere bachelọ nke iwu (LLB) na nsọpụrụ site na Queen Mary College University of London. A nabatara ya n'ụlọikpe ndị England n'afọ 1984 ma nabata ya na uloikpe Naịjirịa n'afọ 1985. Ruo ihe dị ka afọ 20, ọ rụrụ ọrụ n'ụlọ ọrụ iwu onwé onye ma rụọ ọrụ n'okwu gbasara ikike mmadụ karịsịa na ikike ụmụ nwanyị. N'afọ 1998, a kpọrọ ya otú n'ime "Ndị ntorobịa iri pụtara ìhè nke afọ" nke junio Chamber International.[2]
Thompson anọwo n'ọkwa dị iche iche na International Federation of Women lawyers gụnyere Onye isi ala (Onye isi ala) na ónyé isi ala mpaghara maka Africa.[1] A hoputara ya dị ka onye ọka ikpe nke ulo ikpe Africa na-ahụ maka ihe ndị ruuru mmadụ na ndị mmadụ na 27 Julaị 2010 wee bụrụ osote onye isi ala na Septemba 2014.[3][4] Ọ bụ ónyé otu Honourable Society of Gray's Inn ma bụrụkwa Fellow nke Chartered Institute of Arbitrators.[1]
Ndụ onwe onye
dezieỌ lụrụ Sir Igonibo Emmanuel Thompson ma ha nwéré ụmụ.[1]
Edensibia
dezie- ↑ 1.0 1.1 1.2 1.3 Justice Elsie Nwanwuri Thompson. en.african-court.org. Archived from the original on 17 November 2020. Retrieved on 16 September 2016.
- ↑ Ten Outstanding Young Persons of the year 1998. Jci.ng. Retrieved on 16 September 2016.
- ↑ Levitt (2001). Black Women and International Law. Cambridge University Press. ISBN 1107021308.
- ↑ Judicial and Human Rights Institutions. au.int. Archived from the original on 18 May 2019. Retrieved on 16 September 2016.