Elizabeth Isichei
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | New Zealand |
aha enyere | Elizabeth, Mary |
aha ezinụlọ ya | Isichei, Allo |
ụbọchị ọmụmụ ya | 22 Maachị 1939 |
ọrụ ọ na-arụ | historian, university teacher, odee uri |
onye were ọrụ | University of Otago, University of Jos |
Ọkwá o ji | full professor, professor emeritus |
ebe agụmakwụkwọ | Victoria University of Wellington, University of Canterbury, Tauranga Girls' College, Nuffield College, University of Oxford |
academic thesis | Quakers and society in Victorian England |
Ebe obibi | Naijiria |
Ihe nrite | Fellow of the Royal Society Te Apārangi |
nnọchiaha nkeonwe | L484 |
Elizabeth Allo Isichei (a mụrụ na otu puku afọ narị iteghete ịrị atọ na iteghete (1939) na Tauranga, New Zealand ) bu onye Naijiria odee, onye ọkọ akụkọ ihe mere eme na agụmakwụkwọ . [1] [2] Nne na nna ya bụ Albert (onye ọkà mmụta sayensị ugbo) na Lorna Allo. [2] Na abalị ịrị abụọ na atọ nke ọnwa Julaị na afọ otu puku narị iteghete ịrị isi na anọ (1964) ọ lụrụ Uche Peter Isichei (onye na-ahụ maka ọrịa kemịkalụ) ma ha mụtara ụmụ ise. [2] Na na afọ otu puku narị iteghete ịrị ise na iteghete (1959) o nwetara nzere nke BA ya na Mahadum Canterbury dị na New Zealand, BA [2] Na afọ otu puku narị iteghete na iri ịsịi na otu (1961) ọ gụchara MA na Mahadum Victoria nke Wellington, New Zealand, e ruo na afọ otu puku narị iteghete na iri isii na asaa (1967) ọ mesia PhD na Mahadum Oxford. [2] Ọ bụbu nnukwu ọka mmụta Prọfesọ nke ọmụmụ okpukperechi na Mahadum Otago . [3] Ọ bụrịị nnukwu oka mmụta prọfesọ na ngalaba akụkọ ihe mere eme, Mahadum Jos na Jos, Nigeria kemgbe otu puku afọ narị iteghete na iri asaa na isii (1976). [2] Ọ bụ onye nchịkọta akụkọ izugbe nke Jos Oral History and Literature Texts . [2]
Ọrụ ya na akwụkwọ ya gbadoro ụkwụ na Ụka Kraịst na Afrịka na akụkọ ihe mere eme nke Naijiria karịsịa ndị Igbo . [4]
Ọrụ ahọpụtara
dezie- 1964: Echiche ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Ahụmahụ Ọha na Ọha: Ụfọdụ nkọwa Ndị Kraịst nke Alaeze Ukwu Rom, Mahadum Canterbury Publications
- 1970: Victorian Quakers, Oxford University Press
- 1973: Ndị Ibo na ndị Europe: Mmalite nke Mmekọrịta, ruo 1906, St. Martin's
- 1976: Akụkọ Gbasara Ndị Igbo, St. Martin
- 1977: Akụkọ gbasara West Africa kemgbe 1800, Africana
- 1977: Ụwa Igbo: Akwụkwọ akụkọ gbasara akụkọ nke ọnụ na nkọwa akụkọ ihe mere eme, Ụlọ Ọrụ Na-amụ maka Ihe Ndị Mmadụ
- 1981: Kpam Kpam maka Chukwu: Ndụ Michael Iwene Tansi, Macmillan Nigeria
- 1982: Ọmụmụ na akụkọ gbasara Plateau State, Nigeria, Macmillan
- 1983: Akụkọ gbasara Naijiria,Longman
- 1995: Akụkọ banyere Ụka Kraịst na Africa: Site n'oge ochie ruo ugbu a, Africa World Press
- 1997: Akụkọ gbasara obodo ndi Afrịka ruo 1870, Cambridge University Press
- 2002: Olu ndị ogbenye na Africa, Mahadum Rochester Press (Rochester, NY)
- 2004: Omenala Okpukpe nke Africa: Akụkọ, Raeger (Westport, CT)
- 2005: Stoptide, Steele Roberts (New Zealand)
Ntụaka
dezie- ↑ Erik Lönnroth (1994). Conceptions of National History: Proceedings of Nobel Symposium 78. Walter de Gruyter, 116–. ISBN 978-3-11-013504-6.
- ↑ 2.0 2.1 2.2 2.3 2.4 2.5 2.6 Contemporary Authors Online. Biography in Context. Gale (2014). Retrieved on 9 March 2016.
- ↑ Elizabeth Isichei (13 April 1997). A History of African Societies to 1870. Cambridge University Press, 582–. ISBN 978-0-521-45599-2.
- ↑ Kalu Ogbaa (30 January 1999). Understanding Things Fall Apart: A Student Casebook to Issues, Sources, and Historical Documents. ABC-CLIO, 66–. ISBN 978-1-57356-667-4.